Ipob: Ị hụla ndị tụrụ ogbunigwe be Nnia Nwodo

Aka ndị uwe ojii n'Enugwu akparala otu nwoke achụrụ achụ n'ọrụ uwe ojii bụ Ekene Okechukwu na onye otu ya bụ Amah Gabriel ndị ha kwuru na ọbụ ha tụrụ ogbunigwe n'ulọ Nnia Nwodo onyeisi Ohaneze Ndigbo na April 29 afọa.
Gabriel gọrọ sị na ya abụghị onye ohi, na nani ihe ya mere bụ izịgara chief Nnia Nwodo ozi na-ekwentị ya kwa mgbe kwa mgbe na abara ya mba ka ọhapụ ụmụ Ipob aka.
Commishiọna uweojii n'Enugwu bụ Dan-mallam mohammed onye gosipụtara ndị ahụ n'ihu ndị ntaakụkọ kwuru na ha ga-ekpochapụ ndị ji egbe aga ohị nakwa ndị omekaome dị icheichen'Enugwu.
Amah sị: "A na m arịọ mgbaghara n'ihi na amaghịm onye Nwodo bụ, ọ bụ n'igwe okwu nke Biafra ka m nụrụ akara ekwentị ya were zipụ ozi ahụ."

Ebe foto si, Enugu STate Police / Twitter
Cheta na atụrụ ogbunigwe n'ụlọ Nnia Nwodo n'obodo Ukehe n'Enugwu n'ọnwa eprel.
Ndị IPOB gọrọ n'aka ha dị n'okwu ahụ.

Otu Ndị ohi ha jidere dị ụzọ ise.
Na aka ọzọ ndị uweojii gosikwara otu nwoke bụ DSP n'prison ya ndi otu ya na ekweghị ndị Enugwu ṅụọ mmiri tọgbọ iko.
Ya bụ Dsp aha ya bụ Collins Ugwu bụ onye ejidere ebe ha na-ezu ohi ma napụtakwa ha ụgbọala ha zuru ezu.
Ya bụ onye ọrụ prisons na ndị otu ya na esoro ndị sị na bank puta, laa n'ụlọ ha gaa were egbe nara ha yabụ ego, ma gbagbue onye ahụ ọtụtụ mgbe.

Onye isi aba-okpu ọzọ ejidere bụ michael Anthony onye Aninri, nke tachịrị obi tọrọ nwata akwụkwọ Ifeyinwa Ugwu na 13th May 2018, machaa ya elu n'ike ma gbuo ya, lịkwaa ya na obere ili.
Onye ohi ọzọ bụ ndị jị keke napep ebu ngwongwo ndị mmadụ bụ Amoke matheu na Solomon Nwankwo ndị sị Abakalịkị.
Ejidere ha ebe ha bụ Armored cable ha zuru n'ohi were na aga ebe ha ga ere ya.
Ohi Armoured cable bụ nke na ewu ewu n'Enugwu ugbua nke na ha na-aga na ọtụtụ ụlọ nta akụkọ n'Enugwu ga bechasịa ya bụ ụdọ ejị agbasa ozi.
Otu nwatakịrị dị afọ iri na isii aha ya bu Nzubechukwu, ka ejidere dịka onye na edobere ndị otu ya egbe, igwe computer, ekwe ntị, ego nakwa otụtụ ihe ha zuru ezu.
Commissioner Dan-Malam kwere nkwa na ndị ajọ mmadụ enweghị ebe ezumike n'Enugwu steeti.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:









