Ebonyi Explosion: Lee onye uweojii ahụ a sị ogbunigwe aka ya gbagburu n'Ebonyi Steetị

Ebe foto si, Ebonyi State Police
Ndị uweojii Ebonyi Steetị ewepụtala foto onye otu ahụ a sị ogbunigwe aka ya 'hand granade' gbagburu n'Afikpo.
Ha sị na ọ bụ onye otu ha e zipuru ọrụ pụrụiche ka ogbunigwe ya gbara n'obodo Ehugbo dị Afikpo-North, Ebonyi steeti.
- Ọ bụghị eziokwu na a napụrụ ndị ọchịchị Ọwụwa Anyanwụ ndị uweojii na-eche ha nche - Uweojii Delta Steeti
- Ndi Igbo keenụ nkwucha maka ihe ntụmadị - ADF
- 'Ihe kpatara agha Biafra amalitela ime ọzọ ugbua'
- Insecurity in Southeast Nigeria: Ebe niile awakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'Abia, Anambra, Ebonyi, Enugu na Imo steeti
Ogbunigwe gbagburu otu nwoke n'etiti ụbọchị Tuzde na nso Ahịa Eke nke mere ka ndị nwere ụlọọrụ na ọdọahịa mechie, gbalaga n'ihi egwu.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Odah gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ bụ onye ọrụ ha ji otu n'ime ngwaọrụ ha ji arụ ọrụ bụ ihe gbara na mberede.

Oda sị, "Ọ bụghị 'suicide bomber'. Ọ bụ onye uweojii aha ya bụ Inspector Idi Aminu ji ogbunigwe aka (hand grenade) anyị ji arụ ọrụ bụ ihe gbara na-amaghị ama."
"Anyị na-eji ya arụ ọrụ iji chụsasịa ndi mmadụ mgbe o kwesiri. "
"Anyị na-eji ya arụ ọrụ, mụ onwe m yi nkem ugbu a dịka mụ na gị na-akpa nkata".
'Otu onye ji ogbunigwe agbagbuola onwe ya n'Afikpo'

Ogbunigwe gbaara gbuo onwe ji ya n'obodo Ehugbo dị n'Afikpo North, Ebonyi steeti n'etiti ụbọchị Tuzde.
Otu onye bi nso ebe ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọ bụ ka nwoke ahụ na-achọ ịbanye n'otu ụlọakwụkwọ ka ogbunigwe o bu n'ahụ gbara.
Onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ kwuru na ya bụ ihe mere n'agbata Elekere iri na otu na Elekere iri na abụọ nke etiti ụbọchị tara isi naanị otu nwoke ahụ.

Ebe foto si, Ebonyi State Police
Ihe mere ebe ahụ dọtara igwe ndị mmadụ gbakọrọ ịbịa hụ ihe mere, ebe ọtụtụ ụlọọrụ nakwa ọdọahịa nọ nso ebe ahụ mechiri n'ihi egwu.
Nke a bụ mbụ a na-anụ akụkọ ogbunigwe ịgbagbu mmadụ kemgbe mkpamkpa metụtara nchekwa ji ada n'Ọwụwa Anyanwụ.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:













