Insecurity in South East Nigeria: 'Ihe kpatara agha Biafra amalitela ime ọzọ ugbua'

Joe Igbokwe, otu onye ọnụ na-eru n'okwu na otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressives Congress' etiela mkpu na ihe ndị mere n'afọ 1966 nke kpatara agha Biafra amalitela ime ọzọ.
Igbokwe kwuru nke a na kparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị Wenezde.
Ndị sonyere na ya bụ mkparịtaụka gụnyere Maazi Toochukwu Ezeoke, Maazị Joe Igbokwe, na nwa ada Ogechi Ikeh.
Isiokwu mkparịtaụka a bụ ileba anya na mkpebi ndị gọvanọ mpaghara Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa wepụtara n'ọgbakọ ha nwere na Delta Steeti n'ụbọchị Tuzde, abalị iri na otu nke ọnwa Mee 2021.
Joe Igbokwe, onye ndọrọndọrọ ọchịchị

Ebe foto si, Joe Igbokwe/Facebook
Joe Igbokwe, onye welitara isi na gọọmentị Legọs steeti, gbarụrụ ihu etu e si egbu ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ka ọkụkọ n'ala Igbo.
O kwuru na ọ bụ ụdị ihe a mere n'afọ 1966 nke kpatara agha Naịjirịa na Biafra.
- Ipob ahọpụtala onyeisi ESN ọhụrụ n'Imo steeti
- Ipob na ESN ha nwereike ịghọ otu agha nnụpuisi dịka Boko Haram, Fulani ọchịehi na Al-Shabaab?
- Ọ bụ ndị Fulani ka ESN na-ebuso agha na Nsukka, ọ bụghị ndị agha - Nnamdi Kanu
- Ọ bụrụ na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ ahazigharịghị nchekwa ọwụwa anyanwụ, ESN ga-eguzosi ike
Igbokwe kwuru, "Okenye anaghị anọ n'ụlọ ewu amụọ n'ọgbụrị. Anyị ma ndị na-egbu ndị uweojii n'ala Igbo. Ọ bụ ndị be anyị na-eme ya."
"Edeela m akwụkwọ abụọ gbasara agha Biafra, ama m ihe m na-ekwu maka ya."
"Ọtụtụ ndị mmadụ achọghị ikwu okwu n'ihi ụjọ, ọkwa otu a ka o si mee n'oge ahụ."
'State Police', 'Vigilante', ga-ebi okwu enweghị nchekwa"

Ebe foto si, Anambra Govt
N'okwu gbasara nchekwa na Naịjirịa, Igbokwe kwuru na ka ọ dị ugbua na Naịjirịa, Gọvanọ steeti enweghị ikike ịgwa onyeisi uweojii ihe ọ ga-eme na steeti ya.
Igbokwe kwuru na ọ bụn'Abuja ka ndị uweojii si anata ikike tupu ha emee ihe ọbụla na steeti ọbụla.
"Naịjirịa buru nnukwu ibu, ọ karịrị ihe otu onye ga-anọ n'Abuja na-ekwu ihe ga-eme," Igbokwe kwuru.
"Ọ dị mkpa ka e megharịa ọrụ uweojii ka ndị steeti ọbụla nwee nke ha."
"Ọ bụrụ na ekewaa ngalaba uweojii Naịjirịa ka mpaghara ọbụla nwee uweojii nke ha, okwu enweghị nchekwa ga-ala kpamkpam.

Igbokwe kwukawara na ọ bụ eziokwu na ndị mmadụ na-atụ egwu na ndị gọvanọ nwere ike iji ndị uweojii na-emekpa ndị mmadụ ahụ n'oge ntuliaka.
"Mana oge anyị ruru na ya bụ osimiri, anyị ga-ama etu anyị ga-esi gafee ya."
Igbokwe kwukwara na ya kwadoro mmachi ndị gọvanọ machiri ịchịgharị ehi n'ihi na ya bụ ihe amalitela inye nsogbu.
Maazị Ezeoke, onye ọnụ na-eru n'okwu

N'okwu ya, Maazị Ezeoke kwuru na dịka gọọmentị machiri ịchịgharị ehi, ọ ga-adịkwa mma ma gọọmentị steeti dị icheiche nye ndị be ha nwere mmasị ịchị ehi nkwado.
O kwuru na ọ bụrụ na e mee nke a, ọ ga-emepe ụzọ akụnụba ma mekwaa ka ndị mmadụ nwee ọrụ.
Ezeoke kwuru sị: "Ọ bụrụ na e nwee ohere ebe ndị mmad ụ nwere ike ịga n'ụlọakụ gbazite ego iji malite ịzụ ehi, ọ ga-amagbu onwe ya."

"Ọ bụrụ na e bido ịzụ ehi n'ogige (ranch) ọ ga-emepe atụmatụ ahị dị icheiche."
"A ga-enwe ndị ọrụ ha bụ ịkọpụta nri ehi, ụfọdụ amaghị na ọ bụ nnukwu ahịa nwere ike inye mmadụ nnukwu ego."
Ezeoke kwadokwara atụmatụ 'State police', ma kwuo na ọ bụghị eziokwu na ndị gọvanọ ga-eji ya mekpaa ndị iro ha ahụ.
Ogechi Ikeh, onye ọgbambọ maka ikike dịrị onye

Ogechi Ikeh tụrụ arịrị na a na-egbusi ndị uweojii na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ aghara aghara nke o kwuru ga-eme ụfọdụ ụmụnwaanyị ajadu, mekwa ụmụ ha ndị enwenna.
O kwuru na otu ihe so eweta enweghị nchekwa bụ na gọọmentị anaghị akpachapụrụ ndị ọrụ nchekwa anya.
O kwuru na "ndị uweojii na-etinye onwe ha n'ihe ize ndụ iji hụ na ha chekwara ndụ ndị ọzọ, ọ dị mkpa ka gọọmentị na-elebara ha anya."
"A gụchaa ndị ọrụ ahụike na ndị nkuzi, ndị ọzọ e kwesịrị ịkpọ mkpa bụ ndị uweojii, n'ihi na ọrụ ha bụ ichekwa ndụ ndị mmadụ."
"Ọ bụrụ na di m bụ onye uweojii, aga m na-achị obi m n'aka oge niile."
"Ya mere, ọ ga-adị mma ma gọọmentị steeti dị icheiche inwe ego ha mapụtara uche iji na-elebara ndị uweojii anya ma na-akwụ ha ezigbo ụgwọ."













