Ndị Ọwụwa Anyanwu kwesịrị iji ọjị na mmanya gaa rịọ nkwado Tinubu maka 2023 - Joe Igbokwe

Bola Tinubu na Joe Igbokwe

Ebe foto si, Facebook/Joe Igbokwe

Nkọwa foto, Bola Tinubu na Joe Igbokwe
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onye bụbu ọnụ na-ekwuru patị All Progressive Congress (APC) na Legọs Steeti bu Maazị Joe Igbokwe ekwuola na ndị Ọwụwa Anyanwụ kwesịrị iburu mmanya, were ọjị gakwuru Bola Ahmed Tinubu ma rịọ ya ka o kwado otu onye n'ime ha maka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023.

Maazị Igbokwe kwuru nke a na mkparịtaụka BBC Igbo a na-akpọ "Okwu Akpụ N'Ọnụ" nke e mere n'ehihie Mọnde.

O kwuru na ọ bụ eziokwu na ọ bụ ndị Ọwụwa Anyanwụ ka ọchịchị Naịjirịa ruru na 2023, mana ha kwesịrị iji nwayọ gwakwuru ndị ọnụ na-eru n'okwu na mpaghara dị icheiche ma rịọ ka a kwado ha.

Igbokwe gakwara n'ihu kwuo na uche ya na-agwa ya na Tinubu bu n'obi ịzọ oche onyeisiala na 2023, mana ọ bụrụ na ndị Igbo gakwuru ya rịọ ya, o nwere ike ịhapụ ịzọ, ma kwado onye Igbo

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Dịka Igbokwe si kwuo, "Tinubu ehiwela akụrụngwa eji achụnta vootu na mpaghara niile na Naịjirịa, ọ bu sọsọ Chukwu nwereike gbanwe obi ya."

"Jirinu ọjị na mmanya nkwụ ọcha gakwu ya," nke a ka Igbokwe kwuru

Ọ sị na atụmatụ iji mmanya na ọjị gakwu Tinubu bụ makana ọ bụ odogwu n'ihe banyere ndọrọndọrọ ọchịchi ma bụrụkwa onye ga-abara Ọwụwa Anyanwụ uru n'okwu achụmnta vootu na 2023.

"Ọ bụ Tinubu bu na Buhari meriri n'afọ 2015, nakwa afọ 2019."

2023 bụ ohere ỌwụwaAnyanwụ

Aha onyonyo, Mkparitaụka BBC Igbo na Joe Igbokwe

Maazi Igbokwe na Ọkaiwu Jimmy Abia - bu onye sokwa na mkparịtaụka ahụ - kwenyere na ndi Ọwụwa Anyanwụ achịbeghị Naịjirịa n'ụdịrị Onyeisiala mbụ.

Nke a, dịka ha siri kọwa, bụ maka na agaghị agụnye Nnamdi Azikwe n'ihi na ọ bụghi ya bu onyeisiala n'oge ha, dịka Aguiyi Ironsi bụ onye agha n'oge nke a.

Jimmy Abia sị ebe ọbụla e siri lee ya anya, ọ bụ ndi Ọwụwa Anyanwụ ka o ruru.

Agbanyeghị nke a, Ọkaiwu Abia sị na ihe a ga na-ekwusi ike bụ na-achọrọ "Onyeisiala si Ọwụwa Anyanwụ".

Ọ sị na ihe mere nke a jiri di mkpa bụ na ụfọdụ nwereike kuwe Igbo ma chezọọ na ọbụghị sọso n'Ọwụwa Anyanwụ ka Igbo gbara akwara.

"Onye Igbo si 'South South' ekwesighi ịpụta makana Goodluck Jonathan esirila mpaghara ahụ chịa Naịjirịa.

E nwere ọtụtụ ndị tozuru ịchị Naịjirịa n'Ọwụwa Anyanwụ

Maazị Igbokwe sị na-anaghị achọ onye tozuru ịbụ onyeisiala n'Ọwụwa Anyanwụ.

Ọ si na ya ma mmadụ iri tozuru ọfụma ọzọ ọchịchị ma kwuo na ọ dị mkpa ịrụ akwa gaa mpaghara ndị ụzọ.

Ihe mere mkparịtaụka jiri dị mkpa

Aha nkeananụānụ, Nnia Nwodo - Joe Igbokwe amaghị ihe ọ na-ekwu

Jimmy Abia kwenyere n'ihe Joe Igbokwe kwuru gbasara mkparịtaụka n'etiti ndị Ọwụwa Anyanwụ na ndị mpaghara Naịjirịa ndị ọzọ.

Ọ sị na nke a dị mkpa maka na sọsọ vootu si Ọwụwa Anyanwụ agaghị emenwu mmadụ ka ọ bụrụ onyeisiala.

Ọkaiwu Abia sị: "Anyị ga-esetị aka ka anyị na ndị ọzọ kwekọrịta maka atụmatụ a."

Cheta na pati APC kwuburu na ha ga-enye ndị ndịda Naịjirịa ohere ịchị Naịjirịa ma Onyeisiala Buhari rịtuo.