Restructuring: "Anyị na Awusa na Yoroba ga-esusu ọnụ" - Joe Igbokwe

Joe Igbokwe

Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'alaigbo etinyela ọnụ no okwu gbarasa njem nleta ndị ọnụ na-eru n'okwu n"Alaigbo mere na bee Naia Nwodo bụ onye ndụ Ohaneze Ndi Igbo.

Ndigbo dị iche che na-etinye ọnụ na ya bụ okwu na-ekwuputa ụcheobi ha.

Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwuru APC na Legos sị na agbanyeghị na ya bụ njem dị mma, mana na Ndịgbo anaghị achụ ya bụ "Restructuring" ka o sị kwesi.

"Ndị ọbụla kweisiri ị na-agbalị na-achọ otu ọ ga-esi adiri ha mma, mana ihe na-eche m ụche bụ na m amaghị ka anyị ana aga ya n'ụzọ ziri ezi."

Aha onyonyo, Restructuring: "Anyị na Awusa na Yoruba ga-esusu ọnụ" - Joe Igbokwe

"Ndịgbo apụghị ịme ihe dị na ya naanị ha. Anyị kwesiri ịgakwuru ndị agbụru ọzọ dịka Awausa maọbụ Yoroba ka ya na ha rụkọọ".

Igbokwe ịs na ọ bụrụ na Igbo turu vootu nke ọma na ha kaara ịnwe onye ga-anọchite anya ha dịka onyeisi omeiwu ụkwụ bụ onye nwere ike ịnye aka mee ka ya bụ atụmatụ bịa na mmezu.

Mana na nke ahụ emeghị.

Aha onyonyo, Restructuring: "anyị na Awusa na Yoruba ga-esusu ọnụ" - Joe Igbokwe

Greg Anyaegbudike bụ onye ọrụ mmepe obodo zara Joe Igbokwe na "ọ bụghị naanị otu ụzọ ka esi eje ahịa".

Ọ sịkwa na okwu gbasara ịhazighari Naịjirịa abụghị maka ntuliaka ka eji mee ya.

Otoro njem nleta ahụ ndị nwere agba nwere ma na-ekwu na "ntị agaghị ezu ike rue mgbe ihe dị n'ọnụ ya gwụru.

N'ihi nke a, Anyaegbudike kwuru ọ dị mkpa ị na-ekwu okwu gbasara "restructuring" mgbe niile ruo mgbe ọ bịara na mmezu.

Aha onyonyo, Mkparitaụka BBC Igbo na Joe Igbokwe