'Restructuring' a ga-aza ekpere Ndigbo n'okwu gbasara oke?

Ebe foto si, Ebere Ekeopara
Okwu ihazigharị Naijiria nke a kpọrọ 'restructuring' bụ ude na-ede na Naịjirịa kemgbe oge gara aga kpatara na ụfọdụ ndị mmadụ etinyela ọnụ ịchọ ya bụ ihe.
Mana kedụ ihe 'Restructuring' pụtara nhazigharị n'asụsụ Igbo a na-ekwu maka ya?
Ọkammụta Uche Aja kọwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ bụ iwere ike dị n'etiti nye mpaghara dị ịche iche ka ha nwe ike chịa onwe ha ma nwe ikikere ịhazị mpaghara ha.
O kwuru na nke apụtaghị n'obodo ga-ekewa kama na ọ ga-enye ohere mpaghara ọbụla igbo mkpa dịrị ha onwe ha.
N'ọnụ ya, "Nhazi obodo etu a bụ ihe ga-azọpụta Naịjirịa n'ọnọdụ a ọ dị"
Ndị tinyere ọnụ n'okwu a
1. Obi n'achị Ọnịcha
Nke mere nso nso a bụ na Obi na-achị Ọnịcha bụ Igwe Alfred Achebe kwuru na ya bụ nhazigharị obodo dị mkpa.
O kwuru na nke a ga-aka baa uru n'ihi na mpaghara niile kwesiri ị nwe ike ị nye onwe ha nrị n'adaberehe n'enyemaka gọọmentị etiti.
Gụọ ihe o kwuru n'uju ebe a.
2. Ikenga Nnewi
Mazi Dozie Ikedife ekwughi ma o kwenyere na ya bụ nhazigharị, mana o kwuru na a ga-agba mbọ kọwaa ya bụ okwu ọfụma tup o kwenye na ya.
Gee ihe onyonyo a ka ịhụ ihe o kwuru n'uju.
3. Ohaneze NdịIgbo

Ọ bụghị taa ka ike nọ n'azụ ya bụ na ọ bụghị taa ka otu ohaneze ndị Igbo na-achọ ya bụ nhazi akpọrọ 'Restructuring'
N'uche ha, ọ ga-enye ohere ka ndị mmadụ jiri ọnatarachi dị ha n'ime were rụpụta ihe ndị ga-abara ha uru.
Ha kwenyekwara na ọ ga-enyeaka belata mmegbu a na-emegbu ndịIgbo na Naịjirịa.
Gụọ ihe ha kwuru ebe a Ohaneze asaala Ipob
4. Chukwuemeka Ezeife

Ebe foto si, Chinedu Asuzu
Onyebụbu gọvanọ Anambara steeti bụ Chukwuemeka Ezeife sonyere kwado ihazigharị Naijiria na mpaghara.
Ezeife sịrị na ọ ga-ewelite mpaghara ọwụwa-anyanwụ ma weghachie ya etu ọ dị tupu afọ 1954 oge mpaghara ọbụla na-agbara onwe ha mbọ.
5. Atiku Abubakar

Ebe foto si, Getty Images
Onye ndọrọndọrọ ọchịchị chịburu Naịjirịa dịka osote onyeisiala kwuru na oge eruwo a ga-eji hazị obodo Naịjirịa n'ụzọ mpaghara dị icheiche.
O kwuru na ihe nhazi ga-ebute bụ ọchịchị ziri ezi ga-emekwa ka udo dị na Naịjirịa pụta ọfụma maka na ndị mpaghara ọbụla ga-enwe okwu n'ihe gbasara obodo ha.
O ji kwa ohere ahụ kwuo na gọọmentị kwesiri ị sepu aka n'ihe gbasara akụnaụba obodo.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:











