Ipob ahọpụtala onyeisi ESN ọhụrụ n'Imo steeti

Ebe foto si, AFP
Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru ndị otu Indigenous People of Biafra ekwuola na ndịagha Naịjirịa enweghị ike ibatali ogbe ndị otu Eastern Security Network wakpoo ha.
O gwara ụlọọrụ Channels na ndị otu ya ga-emesi gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo steeti maka etu o si gwa ndị agha ka ha gbagbuo ndị otu ha bụ Ikonso.
Powerful gara n'ihu kwuo na ebubo a na-ebo ndị otu ESN na ọ bụ ha wakporo bee gọvanọ Imo steeti bụ asị.
O kwuru na ha ahọpụtala onyeisi ESN ọzọ n'Imo steeti mana ọ gaghị akpọpụta aha ya ma n-ekwu na o nweghị ihe nwereike ime ka ya na ndị otu ya daa mba n'ịchọta Biafra.
O kwuru na ọrụ ESN bụ ịchụsasị ndị Fulani na-eyi ndị mmadụ egwu n'ala Igbo.
O na-ekwusi ike na ọ bụghị ndị otu ESN wakporo bee gọvanọ Imo steeti n'ụbọchị April 24, 2021.
Ihe ise ikwesịrị ịma maka Ikonso bụbụ onyeisi ESN n'Imo steeti

Ebe foto si, Ikonso Don Facebook
Dika ndị otu Ipob nọ na-eru uju maka ọnwụ ezigbo onye otu ha e ji "Ikonso commander" wee mara, lee ihe ndị ikwesiri maka nwaamadi ahụ.
Ikonso Don bụ onye otu Indigenous People of Biafra (Ipob) ama ama ma mechaa bụrụ onyeisi Eastern Security Network(ESN).
Otu onye otu Ipob sị na ọ bụ ezigbote ọyị Ikonso kwukwara n'onyonyo o mere na Ikonso gwara ya na ọ gaghị ekwe ka ndị e chere na ha bụ ndị Fulani wakpo ala Igbo maọbụ dina ụmụnwaanyị Igbo n'ike.
Ọ lụrụ nwanyị ma mụta ụmụ atọ.
Ikonso bụ onye Awomama dị n'Imo state.
Ndị agha Naịjirịa gburu Ikonso ụnyahụ bụ ụbọchị April 25,2021.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ọtụtụ ndị Ipob nọ na soshal midia na-ekwu na ọ bụ ụfọdụ ndị otu ahụ suru Ikonso imi kpatara ndị agha Naịjirịa si chọpụga ya gbuo ya.

Ebe foto si, Ikonso Don Facebook
Ihe Ipob kwuru maka etu ndị agha si gbuo Ikonso Don
Otu Ipob abaala mba maka ogbugbu otu onye ọchị agha ha bụ Ikonso n'aka ndị ọrụ nchekwa Naijirịa.
Ndị nchekwa Naijirịa gburu Ikonso maka ebubo na ọ bụ ya haziri mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii nke dị n'Imo steeti .
N'akwụkwọ mgbasa ozi ọnụ na-ekwuchitere otu Ipob bụ Emma Powerful depụtara ka otu a gosipụtara iwe ha.

Ebe foto si, AFP
O dere sị, "ogbugbo ndị ntoroọbịa Biafra aka ha dị ọcha n'aka ndị Fulani oyiegwu sị na ha bụ ndị ọchị ehi bụ ezigbo ihe obi mgbawa nye anyị".

Ebe foto si, Getty Images
Powerful kwuru sị, "Hope Uzodinma na ndị niile aka ha dị na ajọ ihe a mere ga-akwụ ụgwọ ihe ha mere".
Ọ gara n'ihu kwuo sị "Hope Uzodinma gburu Ikonso maka na ọ jụrụ ị bụ onyeisi otu nchekwa ebubeagu nke gọvanọ ndị ọwụwa anyanwụ hiwere. Uzodinma ji ụzọ dị iche iche ịrabata ndị otu ESN n'Ebubeagụ kama ha ekweghị. ọ bụ ya mere o jiri gbuo ụmụ afọ Biafra ndị sị na ha agaghị emejọ Biafra".
Powerful kwu kwara sị', " Ọ bụ asị na ndị agha wakporo ebe obibi ndị otu ESN, ọ bụ nanị Ikonso ka ha gbalịrị gbuo".
O kwu kwara sị " Hope Uzodinma ekotela ebu, ya kwado maka na anyị ga-echu ya ụra".
Etu ndị agha Naijirịa siri gbuo Ikonso
Ndị agha Naịjirịa egbuola otu onye eji Ikonso Commander mara ha si aka ya dị na mwakpo awakporo isi ụlọ ọrụ ndị uweojii nakwa ụlọ mkpọrọ n'Owere.
Dịka ozi si ogige ndị uweojii siri kwuo, ndị agha gburu Ikonso na mmadụ isii ndi otu ya dịka ha zutere ha n'obodo Awomama.
Ikonso bụ onye Awomama.
Foto so akụkọ sị n'aka ndị ọrụ nchekwa gosiri ozu a sị bu nke Ikonso nakwa ngwa agha di iche iche n'ala.
Ihe onye akaebe bi n'Awomama gwara BBC Igbo maka ọnwụ Ikonso Kommander.
Otu onye Awomama achọghị ka ekwuo aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ n'ime abalị ka ndị agha bịara njem ahụ.
Ọ sị: "anyị malitere ịnụ ụda egbe aghara aghara, nke mere ka ọtụtụ mmadụ gbakpuwe ime ọhịa."

Ebe foto si, Screen grab
Onye a kwuru na mgbe chị foro ka ndị mmadụ na-ekwu na ndị agha chọọrọ otu nwoke ha sị na ọ bụ onye otu Ipob bịa.
Ọ kọwara na ha ghọtara na ndị agha ahụghị nwa amadị a ha chọoro bịa.
O kwuo sị, "ndị agha a gbawara onye ọbụla ha hụrụ ebe ahụ egbe, a hụrụ ihe ruru ozu mmadụ iri ndị agha tinyere n'ụgbọala ha pụwa".
Onye a kwuru na e nwere otu nwoke e gburu n'elu ọgbatumtum ya ma munye ya ọkụ.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Ọ kọwaa sị, "ndị agha a buru ozu ndị a n'ụtụtụ taa n'ihe dịka elekere isii maọbụ asaa gawa ebe anyị chere bụ Obinze bụ ebe ụlọọrụ ndị agha dị".
Onye a kwuru na mgbe ihe dịka nkeji iri atọ maọbụ iri anọ gachara ka ụfọdụ ụmu nwoke yi uwe ojii biara ebe ahụ na-ajụ, " Kedụ ebe ndị agha ahụ nọ?".
Ọ kwuru na ọ chere na ọ bụ ndi a ji iwe gawa Omuma ebe agbara ụlọ gọvanọ Imo steeti ọkụ.
O kwu kwara sị, "ọtụtu mmadụ n'obodo anyi amaghi ebe ụfọdụ ndị bee ha nọ".
Ọ kọwara na ha na-eche na ndị a ana-achọ achọ nwereike ị bụ ndị a ndị agha gburu ma buru ozu ha gawa.
Dịka ọ dị ugbu a, onye a kọwara na obodo ha dị "gharaghara", dịka ndị mmadụ zoro n'ime ụlọ ha.
Dịka akụkọ na ndị nchekwa egbuola Ikonso Kommander, Onye akaebe a kwuru sị "Eeee, ọ bụ ya ka ha chọọrọ bia".
Onye a gwara BBC na ọ bụ Ikonso ka e gburu na mwakpo a.
Ndị uweoji na ndi agha asaghi ekwenti ha banyere akụkọ a.
Etu mkpamkpa a siri metụta Orlu
Ka nke a na-eme ka ndị ọbọdọ Ihioma dị n'Orlu Imo steeti nọ na gbaharịa dịka ha sị na ndị agha Naijirịa gbara otu ụgbọala Toyota Sienna ọkụ.
Ndị hụrụ ka ihe mere kwuru na enweghị onye ha gbara egbe maọbụ nwụchie nanị ya bụ ụgbọala ha gbara ọkụ.










