Orlu Imo State: Ọ bụ anyị kpọrọ ndị agha oku enyemaka - Gọọmentị Imo steeti

Hope Uzodimma

Ebe foto si, Hope Uzodimma

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 8

Onye na-achị steeti Imo steeti bụ Hope Uzodima ekwuola na ọ bụ gọọmentị ya kpọrọ ndị agha Naịjirịa bịa nyere ha aka kpochapụ ndị echeere na ha so n'otu Eastern Security Network

O kwuru na ọ bụ ndị otu ipob bụ ndị kpara nkata ịwakpo obodo Orlu n'aha ịchọ ndị ọchiechi na mpaghara ahụ.

Ozi a bụ nke si n'aka Kọmịshọna na-elekọta ikpe ziri ezi bụ Cyprian Akolisa gwara ndị ntaakụkọ nke a mgbe ọ na-aza ajụju gbasara ihe ndị agha na-eme n'Orlu.

"Mwakpo e mere ụlọ ndị uweojii dị ịcheiche mere n'oge #endsars bụ ndị otu ipob zoro n'okpuru ngagharịiwe ahụ iji zuru ngwa agha" ka o kwuru

Lilu
Nkọwa foto, Ọ bụ n'obodo Lilu nke dị n'Anambara steeti ka ụgbọelu ndị agha Naịjirịa kwara mgbọ, ọ bụghị na Orlu dịka akụkọ si ekwu.

BBC Igbo agaala Lilu nke dị n'okpuruọchịchị Ihiala n'Anambra steeti iji mme nchọpụta nke bụ eziokwu maka mkpamkpa kpara n'ụbọchị Weneezde, abalị iri na itoolu nke ọnwa Febrụwari 2021.

Cheta na akụkọ na-efegharị na ndị agha Naịjirịa ji ụgbọelu ha na-akwa mgbọ n'Orlu ebe ha na-achụ ndị otu Eastern Security Network.

Lilu
Nkọwa foto, Ogbunigwe ndị agha gbariri ọnụụzọ ama ndị mmadụ

Nchọpụta BBC Igbo gosiri na ọ bụghị na Orlu ka ihe a mere kama o mere n'obodo Lilu.

Ndị agha Naịjirịa kwuru na ha zigara ụgbọelu ha na mpaghara ahụ n'eziokwu mana o nweghị ndị ha nyere nsogbu.

Mana BBC Igbo chọpụtara na ndịagha ji ụgbọelu ha gbaa ogbunigwe ma kwaa mgbọ n'okirikiri ahụ.

Otu nwoke kpọgharịrị ndị ntaakụkọ BBC Igbo na be ya ma gosi ha etu ogbunigwe ndịagha si gbarie akụkụ ụfọdụ na be ya.

Lilu
Nkọwa foto, Mgbọ ndị agha mebiri akụkụ ụfọdụ n'elu ụlọ nwoke ahụ

Nwoke ahụ gosiri anyị ọnụụzọ ama ya nke bekee na-akpọ gate, elu ụlọ ya (roof), elu ụlọ nke ime (celiene) nakwa akụkụ ndị ọzọ ndị agha kwara mgbọ.

O kwuru na ọ bụ naanị amara Chineke mere na onweghị onye nọ n'akụkụ ebe mgbọ ndị ahụ nakwa ogbunigwe ndị ahụ dara.

BBC ga-ewetara gị akụkọ a n'uju ya ma anyị chịkọtachaa mpụtara nchọpụta ndị ntaakụkọ anyị gara ime n'obodo Lilu.

Ihe ụgbọ agha anyị gara mee - Ndị agha Naịjirịa

Ụgbọelu ndị agha

Ebe foto si, US Air Force

Nkọwa foto, Ndị agha Naịjirịa kwetara na ha zipuru ụgbọelu na mpaghara Orlu mana ha anaghị enye onye ọbụla nsogbu.

Orlu na-ewu na soshal midia ugbua dịka ọtụtụ na-ekwu na ndị agha Naịjirịa awakpola obodo ahụ ọzọ.

Cheta na ndị agha na ndị ọrụ nchekwa Eastern Security Network kwataburu n'Orlu n'oge gara aga.

Mana n'ụbọchị Tọzde, Febrụwarị 18, 2021 ka akụkọ nakwa onyonyo malitere ifesa nke na-ekwu na ụgbọelu helịkọpta nke ndị agha Naịjirịa na-akwa ndị mmadụ mgbọ na mpaghara Orlu.

Oda Chioma, onye bi n'Orlu gwara BBC Igbo na enweghi ihe gbara gharịị na-eme na mpaghara ebe o bi.

O kwuru na ndị agha ka nọ ebe niile mana o nweghi onye ha na-enye nsogbu.

BBC Igbo jụrụ Igwe Dr Patrick Acholonu, onye a ama ka Didikadi ndị Orlu, o kwuru na ndị agha ka nọ ebe niile mana o nweghi onye ha gbara egbe ma tụọ mgbọ.

Orlu
Nkọwa foto, Etu ime obodo Orlu dị n'ụbọchị Tọzde, Febrụwarị 18 2021

Onye ọzọkwa na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ya anụbeghị ụda egbe n'okirikiri nke ha.

O kwuru sị: "Anyị na-ahụ helịkọpta ka ọ na-efegharị, ndị soja jukwara n'okporo ụzọ, mana udo dị. Anyị anụbeghị ụda egbe n'ogologo oge."

Ọ gara n'ihu kwuo na ụfọdụ na-akọ na ha nụrụ ụda egbe na mpaghara Okporo Orlu, mana n'akụkụ nke ha, ebe niile dị jụụ."

Anyị zigara ụgbọelu helịkọpta n'Orlu mana ha anaghị enye ndị mmadụ nsogbu - Ndị agha Naịjirịa

Ụgbọelu ndị agha

Ebe foto si, US Air Force

Nkọwa foto, Ndị agha Naịjirịa kwetara na ha zipuru ụgbọelu na mpaghara Orlu mana ha anaghị enye onye ọbụla nsogbu.

Ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa, ngalaba 34 artillery Brigade nke dị n'Obinze, Owerri, Imo steeti, bụ Babatunde Zubairu, gwara ụlọntaakụkọ Punch na ha zigara ụgbọelu helịkọpta na mpaghara Orlu.

Zubairu kwuru na ọ bụ n'ihi nchọpụta ha mere, nke bekee kpọrọ 'military intelligence', ka ha ji ziga ụgbọelu ndị ahụ.

Onye ọzọkwa bi n'obodo Uda, Orsuihiteukwa nke dị n'okpuru ọchịchị Orlu, gwara ndị Punch na ụgbọelu ndị agha na-efegharị n'obodo ha nke tinyere ọtụtụ mmadụ n'ụjọ.

Mana onye ahụ kwuru na helịkọpta ahụ agbaghị egbe ọbụla.

O kwukwara na ya bụ helịkọpta fegharịchara ma fepụkwa.

Aha onyonyo, Orlu Crisis: Ndị uweojii na ndị agha nọchiri ụzọ esi aba Orlu

Onyonyo dị icheiche na-agbasa na Twitter na-egosi ụgbọelu helịkọpta na-efegharị nke ndị mmadụ na-asị na ọ na-akwa mgbọ na-agbagbu ndị mmadụ.

Chidi Odinkalu, onye jibu ọkwa onyeisioche 'National Human Rights Commission' tinyere otu ihe onyonyo na Twitter ebe ọ dịka Helịkọpta na-agba egbe.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Aisha Yesufu, onye a ma ama na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye, kwukwara otu ihe ahụ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu gwara BBC Igbo n'ekwentị na ya amaghị maka akụkọ a na-efegharịnụ.

O kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ akpọkwaala ya maka ya bụ ihe.

Ikeokwu gara n'ihu kwuo, na o doro ya anya na ndị agha ka nọ na mpaghara Orlu, mana onweghịzi ndị ha na-enye nsogbu.

Mana anyị na-agba mbọ ịnụ n'ọnụ ndị bi na mpaghara ahụ ka ha kọwaara anyị ihe na-emenụ.

N'aka nke ọzọ ụlọọrụntaakụkọ Punch

Rochas Okorocha agaala Orlu sị ha ka 'Ọzọemena!'

Okorocha na Eze Boniface Okereke

Ebe foto si, Sam Onwuemeodo

Aka chịburu Imo steeti na onye bụ Sinetọ Imo West bụ Rochas Okorocha, onye nnọchiteanya ndị Orlu Imo State gara ebe ahụ, ka ọgbaghara dapụtara na ya biri.

Ọ gwara ndị isi obodo na ndị bi n'Orlu ka ha jikọọ aka hụ na ọgbaghara dapụtara n'Orlu nke tara isi ọtụtụ mmadụ ma mebiekwa akụnaụba ndị mmadụ ghara ime ọzọ.

O kwuru nke a mgbe ọ gara njem nleta nakwa iti aka n'obi na nke Eze Boniface Okereke so na ndị ihe metụtara.

O hibere kọmiti mmadụ asaa ga-elebanye anya n'ọdịmma ndị ihe a metụtara ma nyekwa ha enyemaka ego na ihe ndị ọzọ ha chọrọ.

Rochas Okorocha na ndị ihe metụtara n'Orlu

Ebe foto si, Sam Onwuemeodo

O nyekwara ụmụaka niile nne maọbụ nna ha nwụrụ n'ọgbaghara ahụ onyinye agụmakwụkwọ n'efu.

Ndị ọzọ ọ letakwara bụ ndị si mba Naịja nakwa ezinaụlọ ndị ọzọ ihe a metụtara.

N'ọnụ ya "Obi gbawara m mgbe nụrụ maka ihe mere ebe ụfọdụ ndị mmadụ gụnyere ndị nche tufuru ndụ ha, Ọ bụ ihe ọjọọ mere n'Orlu nke m katọrọ kpam kpam"

Nnamdi Kanu gwara ndị ESN wụsa ọwa n'Orlu

Akụkọ Igbo

Nnamdi Kanu bụ onyendu ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ ndị na-achọ nnwereonwe Biafra nakwa otu

Eastern Security Network (ESN), agwala ha wụsa ọwa n'Orlu.

Nke a na-abịa dịka o kwuru na ọ nụrụ na a gwala ndị agha na ndị uweojii e zigara obodo ahụ mgbe ọgbaghara dapụtara si ebe ahụ pụta.

Kanu gara n'ihu kwuo na ESN laghachị n'ịgbado anya n'ịhe gbasara nsogbu ndị ọchị ehi n'obodo ahụ.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Akụnaụba obodo a adaala kemgbe ihe mere n'Orlu - Eze Amaifeke

Aha onyonyo, Akụnaụba obodo a adaala kemgbe ihe mere n'Orlu - Eze Amaifeke

Kedụ ọnọdụ Orlu nọ n'ime ya ugbua kemgbe ndị agha na ndị a na-eche na ha bụ ndị Eastern Security Network (ESN) kwatachara?

BBC garuru obodo ahụ iji anya ha hụ ka ihe dị ugbua.

Eze dkt. E.C. Okeke gwara BBC Igbo na ndị mmadụ anaghị agagharịcha etu ha si emebu mbụ.

Ka o si gaa n'Orlu n'ụbọchị nke atọ

Mbara ime obodo Orlu

Taa bụ ụbọchị Tọzde ga-eme ya alabị atọ kemgbe amachiri ngagharị ma nọchie ụzọ e si abanye obodo Orlu.

Onye ntaakụkọ BBC ka nọkwa ebe ahụ ahụta ka o si aga nakwa etu ndị mmadụ nọ ebe ahụ si ebi.

Ọ gwakwara Igwe obodo ahụ okwu ịchọpụta ihe mere. Lee ya ebe a:

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Aha onyonyo, Orlu Crisis: Ndị uweojii na ndị agha nọchiri ụzọ esi aba Orlu

BBC Igbo chọpụtara na ọpụpụ na mbata n'obodo Orlu adịghịzị mfe.

O kwuru na ndị agha na ndị uweojii nọchiri ebe niile iji kwụsị ndị mmadụ ọpụpụ na mbata.

Ihe ọzọ bụ na mmachi ngagharị nke gọọmentị steeti ahụ ka dị mana o nweghi onye ma mgbe ọ ga-ebi.

O kwukwara na rue ụbọchị taa, ụda egbe ka na-ada n'obodo ahụ

Ụjọ ka ji ndị mmadụ ịpụta mbara

Aha onyonyo, Orlu Crisis: "Ndị uweojii enweghi ike ịkọwa mmadụ ole nwụrụ n'Orlu"

Orlu tọgbọọ chakọọ tata dịka ndị mmadụ n'eze isi onwe ha.

Nsogbu ahụ dapụtara n'etiti ndị ọrụ agha na ndị Ipob n'Orlu, Imo steeti ka na-agakwa n'ihu ugbua.

BBC chọpụtara na okporo ụzọ nakwa obodo dị iche iche n'Orlu dịka Amaifeke, Okporo na Banana junction dịka ebe agbara ọsọ n'ọdụ ahịa, ụlọ akwụkwọ na ụlọ ọrụ niile gbachiri agbachi.

Lee mmadụ ole nwụrụ n'ọgbaghara dapụtara n'Orlu ụnyahụ

Ebe gbara ọkụ n'Orlu

Ebe foto si, UGC/Other

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu ekwuola na ụfọdụ mmadụ pụtara ụnyahụ bụ Jenụwarị 26,2021 wakpoo ogige ndị Hausa bi n'Orlu ma gbuo ndị agha anọ.

O kwuru na nke a mere ka ndị agha wuchie ebe ahụ .

Ọ gara n'ihu kwuo na ya ejichaghị akụkọ zuruoke gbasara ya bụ mkpa mkpa kpara n'Orlu ụnyahụ.

O kwuru na ka ihe si kwụrụ n'ụtụtụ a, udo alaghachitela ebe ahụ dịka ụfọdụ ndị otu ya nọ ebe ahụ ugbua.

Orlando kwuru na mmachị ngagharị ka dị n'Orlu ugbua.

Orlu
Nkọwa foto, Ma ndị ọrụ aka apụtaghị ọrụ taa dịka anyị si chọpụta

Anyị ka na-ege ntị ịnụta n'ọnụ ya gbasara ọdachị a.

Lee ihe Nnamdi Kanu kwuru maka ihe na-eme n'Orlu

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images/UGC/Other

Onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu etinyela ọnụ n'okwu gbasara ihe na-eme n'Orlu ma kwuo na "Orlu agaghị abụ Obigbo ọzọ".

O ji Obigbo nke dị na Rivas steeti ebe echeere na ndị agha gburu ndị mmadụ n'ụzọ ezighi ezi were amaatụ n'ihe na-eme n'Orlu.

O kwukwara na ọ ga-aga n'ihu ị me ihe ọ na-eme rue mgbe akpọrọ ya oku na "Hague".

Hague bụ ebe ụlọikpe kachasị na-ekpe ndị omekome n'ụwa niile ikpe nọ, ọ dị na mba Netherlands.

"Nwụchie nu ndị aka ha dị n'ọgbaghara a" - Hope Uzodimma

Ebe gbara ọkụ n'Orlu

Ebe foto si, UGC/Other

Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma etinyela mmachị ngagharị n'obodo Orlu dịka ọgbaghara dapụtara n'ebe ahụ.

Amabeghi mgbe mmachi a ga-ebi mana o ga-esi n'abalị rue n'ụtụtụ.

Uzodinma n'ozi ziputere kwukwara na obi adịghị ya mma maka ogbugbu na ọgbaghara ahụ dapụtara.

O zikwara ndị ọrụ nchekwa ozi ka ha nyoo anya n'ala chọpụta ndị aka ha dị n'ogbugbu a.

Ebe ndị mmachi a metụtara bụ

Ihe anyị ma maka ihe na-eme n'Orlu

Ndị agha kwụ n'ọhịa n'Anambra

Ebe foto si, Abs Radio/Tv

Akụkọ na-efegharị na-ekwu na ndị nọ n'Orlu agbaala ọsọ ndụ dịka otu amaghị ndị ha bụ na ndị echere na ha bụ ndị agha Naịjirịa na-akwa mgbọ.

Otu onye nọ ebe ihe mere aha ya bụ Chimezie kwuru na ọ gbapụrụ na be ya gbalaga obodo ọzọ dị nso n'ebe ahụ.

O kwuru sị "ụzọ abụọ banyere n'ime ogbe ebe m bi bụ ndị agha nọchiri ya, ha hiri nne ju ebe niile"

Onye ọzọ BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ bụ Precious kọwara ihe anya ya hụrụ n'ụzọ Orlu taa.

O kwuru na ọ nọ n'ụzọ a ga Orlu mgbe mmadụ ụgbọala anọ bụ ndị mmadụ na-agbali egbe elu zutere ha n'ụzọ.

O kọwara na mmadụ niile nọ n'ụzọ ahụ gbahapụrụ ụgbọala ha mgbe ha hụrụ ihe na-eme.

Precious kwukwara na ọ maghị otu bụ otu ahụ na-agbli egbe elu.

Mgbe BBC kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu, o kwuru na ọ nọ na nzụkọ ma sị anyị kpọghachi ya.

Kedụ etu ọgbaghara a si bido?

Ndị agha Naịjirịa

Ebe foto si, TWITTER/HQNIGERIANARMY

Otụ onye na-achoghi ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na oruola izu ụka abụọ ọ bidoro ịhụ ụmụ okorobịa bu ngwa ọgụ na anọkari n'ime ụgbọala na-agbali egbe elu ka ha na-agbafe n'orlu.

Ọ kwuru na ndi a na-eyikari uwe ojii na okpu na-achaa mmemmé.

Ha nwere-ike ịbụ ụgbọala Sienna, hilux maọbụ jeep.

Ọ kwuru na ndị a anaghị achọ ndị obodo okwu kama ha na-awakpo onye ọrụ nchekwa Obula ha hụrụ n'ụzọ.

Ọ kwukwara na egbe nke a gbara taa na ha gbara ya gbatee ya aka.

Ọ kwuru na enweghị onye ma ndi ha bụ.

Ọ kwuru na ụbọchị olee gara aga ka ndị agha gara obodo ụmụtanze bụ ebe ndị a si aputa, were nwuchie ma gbuo kwa ụfọdụ ụmụ okorobịa ha jidere.

Kama ọ kwuru na ọ bụghị ndị a ka ndị agha ahụ jidere.

Ọ kọwara na ndị agha gbara keke ụfọdụ ndị mmadụ ọkụ dika ndi agha na-ekwu na egburu otu onye otu ha n'obodo ahụ.

Onye akaebe a kwuru na ndị nọ n'obodo Umutanze agbaala ọsọ ndụ ha. Ma sikwa na ya bụ ogbaaghara na ha abanyela obodo ndị ọzọ.