Ebonyi State Ezza Effium Crisis: Mmadụ 25 anwụọla n'ọgbaghara dapụtara ebe ahụ

Mmadụ iri abụọ na ise anwụọla ebe ụlọ otu narị na iri abụọ na ise gbara ọkụ n'ọgbaghara dapụtara n'Ezza na Effium dị n'Ebonyi steeti.
Gọvanọ steeti ahụ bụ Dave Umahi kwuru nke a ma kwuo na anapụtala ndị omekome egbe ruru iri abụọ na isii.
Ọ majara ndị isi mpaghara ahụ na ọ ga-anwụchi ha ma kwụsị ọrụ n'okporoụzọ ọ na-arụ n'ebe ahụ maọbụrụ na ndị ahụ ekpezighi udo n'etiti ha.
Umahi bara mba a na nzụkọ ikpezi udo nke ehiwere n'etiti obodo abụọ ndị a nke ndị ọrụ nchekwa na ndị nọchiri anya ụlọụka so na ya.
"O nweghi mmepe obodo ga-abịa na mpaghara ahụ maọbụrụ na amaghị ihe emere esemokwu a" ka o kwuru.

Ebe foto si, Facebook/Dave Umahi
Ndị uweojii ejichiela ihe ruru mmadụ iri atọ aka ha dị n'ọgbaaghara dapụtara n'Ebonyi steeti n'ụbọchị Sọnde nke tara isi ụfọdụ mmadụ.
Ihe ruru mmadụ anọ nwụrụ n'ọgbaaghara ahụ nke dapụtara n'etiti ndị ọrụ ụgbọala a kpọrọ 'National Union of Road Transport Workers'.
Ebe ya bụ ihe mere bụ n'obodo Effium nke dị n'okpuru ọchịchị Ohaukwu.
Francis Nwaeze, onye enyemaka mgbasaozi nke Gọvanọ Dave Umahi, gwara BBC Igbo na gọvanọ na ndị ọrụ ya ga-aga n'obodo Effium n'elekere mbụ nke ụbọchị Mọnde a.
Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi steeti kwuru na ọ bụ oge a na-eme ntuliaka ndị ga-achị ya bụ otu ka ọgbaaghara nọ dapụta.
Mana akụkọ na-ekwu na ndị nwụrụ n'ọgbaaghara ahụ ruru asatọ.
Dịka ụlọntaakụkọ 'The Sun' si depụta, ndị e jichiri n'ihi ya bụ ọgbaaghara gụnyere Clement Odah, bụ onyeisi okpuru ọchịchị Ohaukwu, Chinedu Awo, bụ onye omeiwu na-anọchi anya mpaghara Ohaukwu, Sunday Agbo bụ nchịkọta 'Effium Development Centre', nakwa Eucharia Ogwale onye nchịkọta 'Effium South Development Centre'.
Ndị ọzọ bụ Emmanuel Uzor na Emmanuel Igwe bụ ndị enyemaka pụrụ iche nke Gọvanọ Dave Umahi.
Akụkọ igbu mmadụ apụtala ugboro ugboro n'Ebonyi steeti n'ọdị nso a dịka ndị otu nzuzo dị icheiche na-aluso onwe ha ọgụ.
Mana ọgbaaghara nke ụbọchị Sọnde bụ nke mbụ na-esi n'aka ndị ọrụ ụgbọala.
Ọtụtụ ụlọ nakwa ụgbọala ndị mmadụ ka a lakwara n'iyi na ya bụ ọgbaaghara.
Gọọmentị etinyela mmachi mkpagharị na mpaghara ebe ọgbaaghara a dapụtara.
Gọvanọ Dave Umahi machikwara ndị NURTW ịrụ ọrụ na steeti ahụ ọzọ ruo mgbe ihe niile dajụrụ.















