Ebonyi Assault: Aka m abụọ na-achọ ịkpọnwụ akpọnwụ - Pastor Okochi Obeni

Ebe foto si, Okochi Chukwu Obeni
Ụkọchukwu Okochi Chukwu Obeni, bụ onye ụmụokorobịa kefere aka azụ ma were ụtalị nyụọ ya ịkpakwụ n'Ebonyi steeti nso nso a, ekwuola na aka ya na-achọzị ịkpọnwụ akpọnwụ.
Obeni gwara BBC Igbo na ọ ka nọ n'ụlọọgwụ kamgbe ya bụ ihe mechara n'ụbọchị 14 nke ọnwa Mee 2020 a. Ọ bụkwa ego akpa ya ka o ji azụ ọgwụ na ihe ndị ọzọ.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ onyeisioche okpuru ọchịchị Afikpo Nọt bụ Ogbonnaya Oko Enyim tinyere aka n'ihe mere ya.
BBC kpọrọ Ogbonnaya ugboro ugboro mana ekwentị ya agaghị aga, ọ zaghịkwa ozi anyị zigaara ya n'ekwentị.
Obeni kwuru na ihe Ogbonnaya ji kpọọ ya asị bụ maka na ya na-akatọ ọchịchị ọjọọ ya.
O kwuru na ugboro ugboro ka Ogbonnaya kpere ya n'aka ndị uweojii mana ndị uweojii jụchara ya ajụjụ ma hapụ ya ka ọ laa.

Ebe foto si, Okochi Chukwu Obeni
Ndị na-arụrụ Ogbonnaya ọrụ mechara gaa kpee ya n'aka otu a kpọrọ Essa Ruling Council, nke bụ otu ọdịnala nke na-elekọta mpaghara ahụ.
Ha boro ya ebubo na ọ na-akparị nwa ha nwoke bụ onyeisioche okpuru ọchịchị ha.

Ebe foto si, Okochi Chukwu Obeni
Nke a mere ka ndị Essa Ruling Council nye iwu ka a kpọta ya, gbaa ya ọtọ, pịa ya ụtalị ma were akpụlekwe nyụchaa ya anya.
Obeni gwara anyị na ha kechiri ya aka n'azụ ihe ruru awa abụọ ma na-ata ya ahụhụ.
Ndị Essa Ruling Council enyeghi ya ohere ọbụla ịzara ọnụ ya n'ebubo ndị otu Ogbonnaya boro ya.
BBC kpọkwara otu onye so na otu Essa Ruling Council aha ya bụ Ezeogo Patrick Aja iji mata ihe merenụ, mana ekwentị ya agaghị aga.
Gịnị ga-emezi ugbua?

Ebe foto si, Okochi Chukwu Obeni
Obeni kwuru na ihe ọ chọrọ bụ ka ndị uweojii nwuchie ndị niile aka ha dị n'ahụhụ a tara ya ma kpụpụ ha ụlọikpe.
Ọ chọrọ ka ndị uweojii jide Ogbonnaya Oko Enyim ma mee ka ikpe nkwụmọtọ chịa.

Ebe foto si, Okochi Facebook
Cheta na ndị uweojii Ebonyi steeti kwuru na ha anwụchiela mmadụ iri bụ ndị so wee taa Obeni ahụhụ.
Yekini Ayoku bụ onye na-arụ dịka kọmishọna steeti ahụ kwuru na ha ga-ahụrịrị njedebe isi okwu butere ụdirị mmegbu a, bụ nke malitere n'ihe Obeni dere na Facebook.
Kedụ ka okwu a si mee?
Ndị uweojii kwuru na ụkọchukwu Obeni dị afọ iri atọ ma bụrụkwa onye Amasiri dị n'okpuruọchịchị Afikpo Nọt, Ebonyi bịara kpesara ụlọọrụ ha na Julius Nyerere bụ onyeisi otu Isi Oru na ndị otu ya kpọ ya gaa n'ama egwuregwu dị n'obodo ahụ.

Ebe foto si, Okochi Obeni Facebook
Ha kechiri aka ya n'azụ ya ma were ụtalị piakachaa ya ahụ nke ukwu ma were mmiri ruru ezigbo unyi wụọ ya.
Nke a mere ka akpọga Obeni ụlọọgwụ ka ọ nata ọgwụgwọ ma nwuchie Nyerere na ndị otu ya maka mwakpo ahụ.

Ebe foto si, Okochi Chukwu Obeni Facebook
Nyocha ndị uweojii mere gosiri na ụkọchukwu Okochi natara ntaramahụhụ maka ihe o dere na Facebook katọrọ ihe onyeisi okpuruọchịchị Afikpo North bụ Oko Eyim, ma na-eto igwe obodo ahụ maka ihe ha kpebiri ha ga-eme Eyim na ndị otu ya.
Kọmịshọna ndị uweojii n'Ebonyi bụ Ayoku rịọrọ ọha ka ha dere duu makana ya na ndị uweojii na-elebanye anya n'okwu a ka ha were mara ihe kpatara ụdịrị agwa ọjọọ ahụ.









