Ebonyi Lawmaker alleged assault of journalists : "Nkemka Onuma kụrụ m aka n'afọ ime m"

Ebe foto si, Grace Egbo
Grace Egbo, Ogochukwu Anoike na ndị ntaakụkọ ndị ọzọ akọọla akụkọ ntaramahụhụ ha gabigara n'aka onye omeiwu Ebonyi steeti bụ Nkemka Onuma.
Ha kwuru na Onuma gwara ndị akpụobi so ya n'azụ ha tie ndị ntaakụkọ ahụ mgbe ha na-achọ ịgba otu onye a họpụtara dịka Kọmishọna ajụjụọnụ.
Na ịkọwa ihe ọ gabigara, Grace Egbo , onye ntaakụkọ Tribune gwara BBC Igbo n'ekwentị na "Ọ kụrụ m aka n'afọ mgbe ọ na-adọrọ nwoke ahụ (Kọmịshọna), adị kwa m ime"
Onye ọzọ ihe a metụtara bụ Ogochukwu Anioke, onye ntaakụkọ The Nation gwara BBC na ọ merụrụ ahụ dịka na-agbalị ịzọpụta onwe ya n'aka ndị na-eti ya ihe.
Anioke ka ọ kọọrọ BBC sị "Ka m na-achọ ịbanye ụgbọala m, ha-ejide ụzọ ya tibe m ihe."
"Ọ bụ onyeisi anyị Tony Nwizu bụ onye zọpụtara m n'aka ha."

Ebe foto si, Grace Egbo
Otu jịkọrọ ndị ntaakụkọ bụ Nigerian Union of Journalists (NUJ) nke ụlọọrụ Ebonyi tinyere ọnụ n'okwu site n'akwụkwọ ozi ha zipụtere n'ebe niile.
Ha katọrọ ya bụ ihe metụtara ndị otu ha ma nye Onumwa abalị atọ iji rịọ ha mgbaghara maọbụ ha ebute ọgbaghara.
NUJ jikwa ohere ahụ kpọọ oku ka ndị ọrụ nchekwa kpachapụ anya ebe ndị ntaakụkọ na-arụ ọrụ ha.

Ebe foto si, Ogochukwu Anoike
Ọnụ na-ekwuchitere ụlọomeiwu bụ Francis Nwifuru gwara BBC Igbo na ihe ahụ mere bụ asị ma kwukwa na ọ nụbeghi maka ya
O sịrị: Ọ bụ asị. Anụbeghị m maka ya."
"Onye na-emeiwu a na-eji akpụ obi abịa ebe ọ na-arụ ọrụ?"
BBC ka na-agbalị ịnweta Nkemka Onuma ka ọ bịa zara isi ya maka ebubo a eboro ya.
Grace Egbo kwukwara na ọ gaala ụlọọgwụ maka ihe a ma nata ọgwụ n'aka dibia Bekee ya.










