Ụlọọrụ ntaakụkọ Uganda:Kọọ maka mwakpo emere gị ma nweta karama mmanya

Ebe foto si, TWITTER/DAILY MONITOR
Ndị ntaakụkọ Daily Monitor dị na Uganda akpasuola ndị mmadụ iwe na soshal midịa maka ihe ha dere gbasara ụmụnwaanyị a wakporo n'ike.
N'ihe ha dere, ha kwuru sị na nwaanyị ọbụla a wakporo n'ike ga-ezitera ha akụkọ ihe ọ gabigara, ga-enwe ohere ịnweta otu "karama mmanya dị oke ọnụahịa".
Dịka ihe gọọmentị ndị Uganda depụtara n'afọ garaaga, a wakpooloa ihe karịrị otu n'ime ụmụnwaanyị ise ruru afọ 15 ruo 49.
Mana Daily Monitor kwuru na akụkọ ọzọ e depụtara gosiri na ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị a wakporo karịrị etu ahụ.
Dịka ha siri kwuo, o ruru pasentị 51 bụ ndị ga-enweta mmekpa ahụ n'aka ụmụnwoke ha na ha nwere mmekọ n'ime ndụ ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Na mbido ọnwa Maachị a, ndị mmadụ tara otu onye omeiwu Uganda ezigbo ụta maka ihe o kwuru n'onyonyo sị "dịka nwoke ị bụ, ị kwesịrị ị na-eti nwunye gị ihe.
"Ị kwesịrị ịmetụ ya nwaobere aka, tie ya ihe iji hazigharịa omume ya."
Akụkọ ga-amasị gị
Kemgbe ndị mmadụ ji tinye ọnụ n'okwu a, ndị Daily Monitor arịọla mgbaghara maka 'nghọtaghie ọbụla' ihe ha dere buterela ndị mmadụ.
Ha ehichapụkwala ihe ha dere n'igwe okwu, mana ọ kwụsịghị ụfọdụ ndị mmadụ ikwuputa iwe ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

End of X post, 3

End of X post, 4