Coronavirus Cure: Coronavirus abụghị ọrịa ọhụrụ - Maurice Iwu

Ebe foto si, Getty Images
Maurice Iwu bụ ọkammụta n'ihe gbasara ịmepụta ọgwụ nke bekee kpọrọ 'Pharmacist'.
Ọ bụkwa ya bụ onyeisi kọmiti na-ebuso coronavirus agha n'Imo steeti na BBC Igbo nwere mkparịtaụka.
Na mkparịtaụka a, o tinyere ọnụ banyere ọtụtụ isiokwu gbasara ọrịa Covid-19 na ihe ndị ọzọ so ya.


Iji maa atụ, o kwuru na enyemaka ndị mmadụ nyere onwe ha n'oge dị etu a tụrụ ya n'anya.
O kwuru na nri ndị mmadụ kere ibe ha nakwa enyemaka ndị ọzọ bụ ihe nyere ndị mmadụ aka ịgbochi mfesa ọrịa.
Lee ihe ndị ọzọ o kwuru n'ịchafụ:
- Ọrịa coronavirus abụghị ihe ọhụrụ, ọ bụ ọrịa pụtara kemgbe afọ 1960
- O teela aka ha malitere ịchọpụta ihe gbasara ọrịa coronavirus, ya bụ kemgbe mgbe ahụ amalitere ịchọ ọgwụgwọ ọrịa Ebola
- O kwuru na n'ihi ọrịa abịala mbụ na a ma ebe a ga-akwa ya aka, kwatuo ya, e nwere ọgwụ atọ e nwereike iji mee nke a
- Mana a ka na-atule ọgwụ ndị a dịka ha nyere ya ndị dibia Bekee ndị ọzọ na-atule ya
- Ndị Chaịna ji ọgwụ a gwọọ onwe ha n'afọ 2005 ruo 2014 mgbe ọrịa nke abụọ bịaghachiri
- O kwuru na nnyocha na ntule nille a na-eme ọgwụ a na-aga n'ihu n'agbanyeghị na gọọmentị Naịjirịa anabatachaghị ya
- Maurice Iwu kwere nkwa na ọ ga-emepụta ọgwụ ya nyere ndị mmadụ mba ụwa niile aka.
Gịnị bụ uche ya gbasara mgbọrọgwụ mba Madagascar nke gọọmentị zụtara?

Ebe foto si, AFP
O kwuru na ọ maghị ihe nọ n'ime ọgwụ ahụ ma kpoo oku ka e mee ya nyocha dịka e si etulee nke ya.
N'ọnụ ya "Ndị Madagascar ma ihe ha mere nakwa ihe ha tinyere n'ime ya" ma kwuo na o nweghi nsogbu maka ọgwụ ahụ.
Ọ kọwara na ihe dị mkpa na ihe ọ chọrọ bụ ihe ndị ga-eme ka ọnwụ si n'aka ọrịa belata n'ihi na ọ karịala.
N'otu aka ahụ ọ kwadoghi mmepe obodo nke gọọmentị Naịjirịa na-eme nwayọ nwayọ.
Ọ kọwara na o kwesighi ka Naịjirịa soro obodo ndị ọzọ mepee ugbua n'ihi na ọrịa coronavirus ka na-arị elu ebe a.
Maurice Iwu kwuru na ọrịa coronavirus ga-agbanwe etu ndị mmadụ si ebi ndụ n'ụwa n'ihi na onweghi ihe ga-adịkwa ka ọ dị na mbụ.
Akụkọ ndị ga-amasị gị













