Madagascar Cure: Ntule ọgwụ ọbụla tupu enye ya ndị mmadụ dị mma - Dọkịta Bekee

Ebe foto si, AFP
Otu dọkịta a na-akpọ McGinger Ibeneme ekwuola ka ọ ha ya gbasara mgbọrọgwụ mba Madagascar nke Naịjirịa zụtara maka iji gwọ ọrịa Covid-19.
O kwuru nke a dịka akụkọ pụtara na-ekwu na gọọmentị Naịjirịa azụtala ụfọdụ ọgwụ a "iji tulee ya ọfụma" tupu ha enye ndị mmadụ.
McGinger gwara BBC n'ekwentị na "Coronavirus anyụọla mba ụwa ịkpakwụ, anyị chọrọ ka ya bụ ọrịa laa ya mere m ji akwado ntule ọgwụ ọbụla".
"N'uche m, ma Chloroquine ma nwanne ya bụ Hydroxychloroquine kwesiri ka etule ya tupu enya ya ndị mmadụ".


Onyeisiala mba Madagascar bụ Andry Rajoelina kwuputara na ndị sayensi mba ya achọpụtala ọgwụgwọ ọrịa Covid-19 n'ọnwa Eprelu.
Mba dị icheiche dịka Tanzania, Guniea Bissau, Senegal, Congo-Brazzaville azụtala ọgwụ a n'aka Madagascar.
Ngalaba ahụike mba ụwa bụ WHO n'aha ịchafụ adọọla aka na ntị gbasara ya bụ ọgwụ ma kwuo "mba Afrịka dịka mba ụwa niile kwesiri ịnweta ọgwụ enyochara ma hazie ọfụma maka ọgwụgwọ ọrịa a".
N'otu aka ahụ ọgbakọ ECOWAS agọrọla aka ha na ụkwụ ha gbasara ike ya bụ ọgwụ nwere n'ịgwọ Covid-19.
Ọgbakọ mba Afrịka bụ AU n'ịchafụ gwakwara mba Madagascar ha wepụta ndekọ gosiri na ha enyochala ọgwụ a ọfụma tupu ha anabata ya.









