Coronavirus vs Lassa: Ihe ndị ọrịa abụọ a ji yie onwe ha

Ebe foto si, Getty Images
Ọrịa abụọ na-akpọtụ ugbua bụ ọrịa Coronavirus nakwa ịba Lassa.
Ụjọ ji ụmụ Naijiria maka ọrịa a n'ihi egwu na ọrịa abụọ nwere ike iifesaa na ala Naijiria.
Coronavirus bụ ajọ ọrịa na-efe efe nke a na-ebute n'ikuku na-emetụta akụkụ ahụ e ji ume ma nwekwa ike igbu onye o ji na-egbughị oge.
Nke mgbe o bidoro na ngwụcha afọ 2019 rue Jenụwarị 2020, ọrịa egbuola mmadụ karịrị otu nari ebe mmadụ karịrị puku asaa buterela ya, nke ọtụtụ n'ime ha bụ na mba China.
N'aka nke ọzọ, Iba lassa bụ ọrịa na-efe efe nke a na-ebute site n'iri ihe oke bụ ọrịa ahụ metụrụ ọnụ maọbụ nyụnye nsị maọbụ mammiri.
Ọrịa Lassa atala isi mmadụ 11 na steeti dị 11 na Naijiria.
Ebe Conoravirus na Lassa siri yie onwe ha
- Ọrịa abụọ na-efe efe nnukwu
- Ha abụọ na-eme onye bu ya ahụọkụ
- Ha abụọ na-eme azụzụ
- Ha abụọ nwere ike ime ụkwara
- Ha nwere ike igbu onye na-arịa ya iabali ole ma ole ha butere ya
- A ga-ebutenwụ ọrịa abụọ site na ịnọka ọnụ n'ụlọ, ụlọrụ mabụ n'ụlọọgwụ
- E nwegị ọgwụ mgbochi maka Conoravirus na ọrịa Lassa
Njirimara Conoravirus
Dịka WHO siri kọwa na websait ha, njirimara onye Conoravirus ji gụnyere
- Ikuli ume elu
- Oyi ịba ahụ,
- Ntikpo umeju (kidney failure)
- Ọnwụ nwekwara ike iso ya.

Njirimara Ịba Lassa
Ịba Lassa na-eji ahụọkụ na ike ọgwụgwụ abịa nke mere na ọtụtụ na-eche na ọ bụ ịba.
Njirimara ndị ọzọ dịka WHO siri kọwaa gụnyere:
- Isi ọwụwa
- Ọnya akpịrị
- Obi mgbu
- Afọ mgbu
- Afọ ọsịsa
- Ọnwụ nwere ike igbu onye na-arịa Lassa na abalị iri na anọ ọrịa(14) ahụ bidoro.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:









