Rice meal on Sunday: Etu ndị Igbo si bido riwe osikapa n'ụbọchị ụka

Ebe foto si, Ntanta delicacy Instagram page
- Onye dere ya, Chioma Obianinwa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo
Osikapa n'ụbọchị ụka, o na-egbukwanụ oge? Mbanụ ka ndị Igbo ga-aza gị.
Ma anyị na-ede akụkọ a, na-elegara anya ka anyị ga-esi riwe osikapa nke ụbọchị ụka.
Osikapa bụ otu nrị ụmụ Naịjirịa ejighị egwu egwu tụmaadị ụbọchị ụka.

Ebe foto si, Getty Images
Ha nwere ụzọ ole na ole ha si eri ya bụ nri.

Ebe foto si, @9jadelicacies
Ụfọdụ ndị na-eji ofe akwụ, ofe tọmato, jọlọf, maọbụ eghere eghe wee hazie ya.
Kedụ ka o si malite?
Ọkammụta n'ihe gbasara nri bụ dọkịta Florence Uchendu kwuru na oriri osikapa ụbọchị ụka na Naịjirịa enweghị ụbọchị a ga-asị na ọ malitere iche.

Ebe foto si, @foodace/instagram
Kama na a na-ahụta ya bụ nri ka nri ndị ọgaranya mgbe gboo mere na mmemme ọbụla ị gara a na-ejikarị ya ele ndị ọbịa mgbe ahụ.
O kwuru na ugbua ya bụ nri abụrụla omenaala tụmaadị na mmemme maọbụ ụbọchị ụka ọbụla n'ala Igbo nakwa Naịjirịa.
Gịnị kpatara nke a?
Dọkịta Uchendu kwuru na ihe ndị a bụ ihe o chere mere ka a na-erikarị osikapa ụbọchị ụka.
- Ọ dị mfe osisi
- Ụmụaka ejighị ya egwu egwu ya mere nwata ọbụla na-erighị ya ụbọchị ụka na-eme ka azụ esi na mmiri gụpụta.
- Ọ bụ omenaala dabaara onye ọbụla
- Ụzọ niile esi eri ya na-atọ ụtọ
O nwere ọghọm dị na ya?
O kwuru na o nweghị ọghọm dị ya kama na ebe nsogbu dị bụ ma ọ bụrụ na ezinụlọ ahụ na-eri osikapa ụtụtụ, ehihie nakwa abalị kwa ụbọchị.
N'ọnụ ya, "ahụtaghị omenaala iri osikapa dịka nke nwereike ịkwụsị belụsọ osikapa alara kpam kpam."
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:











