Igbo foods: Lee nri ndị e riri oge agha Biafra, ụfọdụ ka a ka na-eri ugbua

Ji a gwọrọ agwọ

Ebe foto si, Instagram/Utakaegbe1

    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Nri dị ezigbote mkpa nye ndị dị ndụ, mere na ọtụtụ ga-ejinwu ihe ọbụla ọ dị ha ka ọ ga-abanwu n'afọ mere nri.

N'ụwa ugbua, ọtụtụ ndị e nweela ikike ịhọ nri ha ga-eri, ebe ị ga-anụ "ana m eri ji, anaghị m eri ede".

Mana oge agha Biafra, n'ihi etu o si raa ahụ inweta nri, ndị mmadụ riri ihe ọbụla ha hụrụ, ma ọ dị ahụ ha mma ma ọ dị njọ.

Ihe mere bụ na ka agha gachara, ndị Igbo bịara were nri ndị a tụgharịchaa ya, na-esiputa ya etu ọ ga-esi na-atọ ụtọ n'ọnụ.

Lee ụfọdụ nri ndị Igbo malitere iri mgbe gboo na ụzọ e si eri ha ugbua:

1) Akpụ (ji akpụ)

Akpụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, N'oge agha, a na-abacha azụ akpụ, saa ya mmiri were mmanụ na ụgba gwọọ ya tupu e rie ya

Akọwa akụkọ mgbe gboo ghara ịkpọpụta akpụ, mara na onye na-akọ akụkọ ahụ bụ nwa a mụrụ taa.

Akpụ bụ nri e nwereike ịkpọ 'ọzọ Igbo ndụ' maka etu e si eri ya mgbe gboo, ọkachasị mgbe agha Biafra bidoro.

Nke bụ na oge agha, ndị mmadụ nọ na-eri akpụ na-abaghị ya na mmiri (bụ etu e si eme ya ugbua tupu e rie ya).

Ugbua, a na-eri akpụ n'ụzọ dị iche gụnyere ịkwọ garị, abacha, ime eberebe jiakpụ, akara jiakpụ, wdgz.

Akara jiakpụ
Nkọwa foto, Akara jiakpụ bụ akpụ e ji mmanụ nri ghee nke etinyere nnu na ose

2) Ji

Akụkọ ji dịka nwanne ya bụ akpụ (a ga-akpọ otu aha ghara ịkpọta nke ọzọ)?

ji

Ebe foto si, Getty Images

Ji so n'ihe ndị zọrọ igbo ndụ oge gboo ma n'oge agha, ma soro kwa na nri ndị Igbo anaghị eji egwu egwu ugbua.

E nweela ụzọ dị iche iche e si emepụta ji maka oriri.

A na-asụ ya asụ eji eri ofe, a na-aghụ ya n'ọkụ jiri mmanụ nri rie ya, a na-esikwa ya esi jiri mmanụ nri, ji agwọrọ agwọ, nke eghere eghe, stuu nakwa ihe dị iche iche eri ya.

Ji a hụrụ ahụ
Nkọwa foto, A na-eji ji a ghụrụ aghụ akwa ọbịa

3) Ero

Oge gboo, ụfọdụ na-eji ero emere anụ, mana ugbua, ọtụtụ na-eji ya emere ihe e ji atagharị ọnụ n'ime ofe n'agbanyeghi na anụ ga-adịkwa n'ofe ahụ.

Ero
Nkọwa foto, E nwere ọtụtụ ero dị iche iche, mana ọ bụghị ero niile dị mma oriri

Ero na-atọ ụtọ n'ofe mana ọ bụghị ha niile dị mma itinye n'ọnụ, nke a mere na onye amaghị anya ero ekwesịghị ịkpata ero n'ọhịa.

E nwere ero a na-akpọ ata-achakaanya, ero nnọọhịa, atakata e loo nakwa ndị nke dị iche iche.

O so na nri ndị zọrọ Igbo ndụ, mana ugbua ọ bụghị mmadụ niile ka ọ na-amasị iri ya.

Ka ọ dị ugbua, ọ bụghịdị nwaafọ Igbo niile a mụrụ site n'ihe dị ka afọ 1990 ruo ugbua detụrụla ya ọnụ.

4) Ede:

Ede
Nkọwa foto, N'oge agha, ụfọdụ ndị mmadụ ji akwụkwọ ede mere akwụkwọ nri ha ji agwọ ji

Mana ọ dị ka ịchọta agbụsị n'ime akpa nnu ịhụ onye ka na-eji akwụkwọ ede esi ofe ugbua.

N'aka ọzọ, mkpụrụ ede na onwe ya bụ ihe na-aga ahịa ma ruo ugbua, dịka a na-eji ya eme ụrị na-eme ka ofe rọọ arọ, ebe a na-eri ụfọdụ n'ime ya eri.

Ugbua a na-esi ede esi rie ya etu e si eri ji. A na-esi ede agwọrọ agwọ, ụfọdụ ndị na-eghe ya eghe na-ata ka ihe ntagharị ọnụ a kpọrọ 'cocoyam chips' n'olu Bekee.

5) Akwụkwọ nri:

Ụfọdụ akwụkwọ nri ndị Igbo na-eri ugbua malitere oge agha, mgbe nri kọrọ ezigbo ụkọ.

Ọtụtụ bụ ndị ha siri na-ejighi nnu na ose, mana ugbua a na-akwọ aka sie akwụkwọ nri ndị a tinye ma anụ ma azụ, ọ na-atọwa ntị.

Akụkwọ nri ndị dị ka 'ucheakọrọ' (o yiri akwụkwọ akpụ) bụ nke ọ na-abụ a gbachaa ya n'anwụ ka ọ ghara ịgbarisi, a fọọ ya afọọ ka ọ dị ka onugbu tupu e were ogiri na azụ na ose sie ya.

Ọzọ bụkwa nke a ma dịka 'okwe oyibo' (a na-eji ya dịka ụgụ) e ji ya esi ofe egwusi na nke a ma dịka 'ofe osikapa' mgbe ahụ.

E ji ụfọdụ akwụkwọ mere ọgwụ:

A na-eji akwụkwọ mkpụrụosisi ọkwụrụarọ (pawpaw), akwụkwọ mangoro na akwụkwọ lemọọnụ eme ọgwụ e ji agwọ ịba.

A na-esi ya esi, ṅụọ ya aṅụọ ma jirikwa ya saa ahụ.

Aha onyonyo, Etu esi ahazi Ji Kpacha

6)Osikapa:

Mgbe gboo ọkachasị mgbe agha, a na-enwe ụdịrị osikapa dị iche iche nke gụnyekwara nke Abakaliki.

E nwere osikapa ụzọ ụlọ mana makana e nweghi etu e si ticha ya oge ahụ, a na-esi ya etu ahụ kama ọ ga-eji nji ma e sichaa ya.

Ugbua a na-esi osikapa n'ụzọ dị iche iche gụnyere 'jọlọf', nke e ghere eghe, nke mmanụ nri, nke stu, nke ofeakwu, ụfọdụ na-ejikwa ofe dịka ofe egwusi eri ya.

Aha onyonyo, Rice economy: Ihe niile dị n'osikapa bara uru

7) Anụ:

Oge agha a na-eji ụfọdụ anụmanụ gụnyere agwọ, ngwere, oke (ma nke ụlọ ma nke ọhịa), wdgz eme anụ.

Ụfọdụ ndị ka na-eri ugbua, mana ụfọdụ na-asọkwa ha nsọ.

Anụ ọhịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A na-agwọ anụ agwọ, eghe ya eghe, ahụ ya n'ọkụ amịkpọ ya amịkpọ ma mgbe ahụ ma ugbua.

8) Ọka:

Ị jụọ onye ọbụla hụrụ agha Biafra, otu ihe ha ga-akpọ aha bụ 'corn meal', bụ ihe a na-eke ha oge ahụ.

Ọ bụ ihe e si n'ọka mepụta.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a maka ụgba agwọrọ agwọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Igbo delicacies: Ị hụtụla ụgba pụrụiche ndị na-asọ anụ?