Border Closure: Lee ihe nri na-ada n'ahịa ugbua

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụ afọ Naijiria na-eti mkpu dịka ọnụ ahịa ọtụtụ ihe gụnyere ihe oriri rịrị elu ọjị dịka gọọmenti etiti mechiri agbata Naijiria na mba ndị ọzọ ebe ahịa ndị a si abata.
Ihe oriri dịka osikapa, mmanụ ọpapa, anụ ọkụkọ na ngwa e ji esi nri dịka tomato n'adazị ọnụ ugbua n'ahịa karịa etu ọ dị na mbụ.
Gọọmenti onyeisiala Naijiria bụ Muhammad Buhari ekwuru n'ezie na mmechi e mechiri agbata Naijiria na mba dị ọzọ butere ihe ịda oke ọnụ.
Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed bụ onye kwuru nke a ka e nwechara ọgbakọ ndị imezi gọọmenti etiti a kpọrọ FEC n'aha ịchafụ na nso nso a.
Lee ọnụ ahịa ụfọdụ ihe oriri tupu emechie ụzọ na ugbua e mechiri ụzọ:
Osikapa

Ebe foto si, Getty Images
A na-ere otu osikapa ihe dịka puku naira iri na atọ rue puku naira iri na ise (N13,000-N15,000).
Mana ugbua e mechiri ụzọ, akpa osikapa na-adazi puku naira iri abụọ na-asatọ.
Ndị na-ere osikapa kwuru na ụfọdụ ha anaghị ahụ osikapa ha ga-azụta n'aka ndị na-akọ ugbo osikapa na Naijiria.
Anụ ọkụkọ
Tupu gọọmenti emechie ụzọ, a na-ere anụ ọkụkọ 'fridge' otu puku naira(N1000) maka otu kilo na Legọs.
Mana ugbua, ihe anụ ọkụkọ e tinyere na 'fridge' na-ada bụ otu puku, narị anọ(N1400).
Tomato

Ebe foto si, Getty Images
Tomato sokwa n'ihe ndị ọnụ ahịa ha rịrị maka mmechi agbatta Naijiria na mba ndị ọzọ.
Iji maa atụ, e reburu otu kilo tomato N6500 ma ugbua ọ bụzị N8070.
Mmanụ ọpapa

Mmanụ ọpapa na-adabu puku naira itoolu na narị ise(9,500) tupu gọọmenti emechie agbata Naijiria na ndị mba ọzọ.
Ugbua, ọnụ ahịa mmanụ ọpapa bụzị puku narị naira iri na otu (11,000).
Azụ friji

Ihe azụ friji na-ada tupu e mechie ụzọ bụ otu puku maka otu kilo.
Mana ugbua, ọnụ ahịa ya arịruola otu puku , nari naira abụọ.










