Child marriage: Kedụ aha ole iwu kwuru ka alumdinanwunye na Naijiria?

Ụmụaka lụrụ onwe ha

Ebe foto si, NTA

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onye ọkaiwu ekwuola na o nweghị iwu nwata nwoke dị afọ 17(iri na asaa) lụrụ nwaanyị dara dịka ọ bụ n'ụzọ omenala ka ha mere alụmdịnanwunye ha.

Soshal midia nwuru ọkụ dịka akụkọ pụtara nke na-ekwu na ụmụaka abụọ lụrụ onwe ha na Nnewi Anambara steeti.

Somto Nwachukwu, onye Obiofia Otolo Nnewi mere emume alụmdina wunye dn'ụzọ omenala, ihe dịka otu ọnwa gara aga, dịka ononye achọghị ka a kpọaha ya gwara BC Igbo.

" Amaghị ihe o ji buru ugbua ka ya bụ akụkọ na-ewu. O mere ihe karịrị otu ọnwa gara aga."

N'ala Igbo, a na-alụrụ nwata nwoke a mụụ naani ya nwaanyị n'oge iji gba mbọ hụ na aha ezinaụlọ ya efughị, mana onye mgba ama bụrụkwa onye obi ọhịa kọwara na ọbụghị naanị Somto ka a mụrụ.

Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya:

Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na o nweghị ihe ọjọọ dị ya, ebe ọtụtụ ya bụ ihe adabachaghị n'anya ya.

Mana Ọkaiwu Chukwuemeka Eze nke Mahadum Nassarawa StateUniversity gwara BBC na "O nweghịkwa iwu o megidere."

"Iwu Children and Young Person Law kwuru na nwa dị afọ iri na asaa etoola ị sị na ọ bụ dịmkpa."

Eze gara n'ihu kọwaa na nke nwaanyị dị afọ 16 ka bụ nwata n'ihu iwu Naijiria.

Gee ihe Ọkaiwu Eze kwuru n'uju:

Aha onyonyo, O nweghịkwa iwu nwa dị afọ 17 lụọ nwaanyị megidere- Ọkaiwu
Aha nkeananụānụ, Child bride: Ụbịam so ebute nsogbu iluchu di

"Akwụkwọ ekweghị Somto agụ nke mere ka ọ kwụsị na JS 2."

"O bidoro na-agwa ndị mụrụ ya na ọ chọrọ ilu nwaanyị."

"O kwugidere , ha kwado ya ọ gaa lụta nwaanyị."

Akụkọ ndị ga-amasị gị