Child Marriage: Ọghọm dị n'alụmdi nwa nwata na Naijirịa

Ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị

Ebe foto si, unicef.org/Aknigbulu

Ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ụmụaka bụ United Nations Children's Fund (UNICEF) akpọọla oku maka ụmụnwaanyị Naịjirịa.

Ha kwuru na Naịjirịa aghọrọla mba nke abụọ ebe ịlụ nwata nwaayị ka di elu nakwa mbụ na mba Afrịka niile.

Nyocha ha mere gosiri na ihe ruru ụmụnwaanyị nde iri abụọ na atọ (23 million) lụrụ di mgbe ha dị na nwata.

O kọwara na di alụrụ na nwata a so na ihe mere ka ụmụaka kwụsị ịgụ akwụkwọ maọbụ agụghị akwụkwọ chaachaa.

Na Naịjirịa otu n'ime nwata ise anaghị agụ akwụkwọ nagbanyeghị na iwu ala hibere agụmakwụkwọ Primary n'efu.

Aishatu Mohammed

Ebe foto si, other

Cheta na nwunye aka na-achị Bauchi steeti bụ Aishatu Mohammed kwuru na ọ dị sọsọ afọ iri na isii mgbe ọ lụrụ di ya.

O kwukwara na ọ gachabeghị akwụkwọ mgbe ọ lụrụ di.

Gịnị na-ebute alụmdi na nwata?

Ụmụakwụkwọ sekọndrị n'ugwu Naịjirịa

Ebe foto si, unicef.org/Abubakar

Otu onye na-azọ oke ruru mmadụ bụ Akinropo Akinola kọwara na alụmdi na nwata a kachasị dị njọ na mpaghara ugwu Naịjirịa.

O kwuru na ụfọdụ ihe na-eme ka alụmdi na nwata na-aga ihu n'agbaneyghị na gọọmenti Naịjirịa mere ya ka ọ bụrụ ihe dara iwu n'afọ 2003 gunyere:

  • Amaghị ihe: O kwuru na amaghị ọghọm di na ya na-eme ka ndị nne na nna kwe ka nwata nwaanyị ha gaa di na etozughi etozu
  • Oke ụbịam: Akinola kwuru na ihe ọzọ na-eme ka nwa nwaanyị gaa di bụ na enwereike ezinaụlọ nwata ahụ achọtara ya onye nwere ego ga-elekọta ha niile dịka di
  • Ofufe: Iji ma atụ, Akinola kwuru na ụfọdụ ndị alakụba na-emekarị ihe n'ihi nkwenye ha nwere na onye amụma ha bụ Mohammed mekwara otu ihe ahụ.
  • Iwu ala Naịjirịa: Na nkọwa ya, o kwuru na ọ dịghị mfe ịkpụpụ ndị dara iwu ma lụọ nwaanyị mgbe ọ bụ nwata n'ihi etu esi de iwu ala Naịjirịa. O kwuru na ọ dịghị mfe ịchekwa nwa nwaanyị nakwa nwa nwoke na Naịjirịa n'ihi na iwu ahụ edochaghị anya nke mere na ndị mmadụ nwereike ịmịgharị were gbalahụ nwuchi.
Aha onyonyo, E kwesiri ime enyi tupu amalite alụmdinanwunye?

Ọ bere arịrị n'ugbua, ọha anaghịzi etinye anya na ọzụzụ nakwa nchekwa nwata dịka ọ dị n'oge gboo.

O kwuru na n'ihi etu ọha mmadụ si dịrị taa, o nweghi onye chọrọ ịma ma ihe ọjọọ na-eme agbatobi ya nke mere na ndị na-alụ nwa nwaanyị na-anwata n'ala n'efu.

Na ngwụcha, ọ kpọkuru gọọmentị oku ka ha tinye anya hụ na iwu ala mere ya mfe ịlụ ọgụ ma gbapụta ụmụ nwata nwaanyị nọ na alụmdi nwata.

Aha onyonyo, Ndụmọdụ Charly Boy maka alụm di na nwunye