Chibok Girls: Ihe mere nne na nna ji etinye uche n'aka 'ụkọchụkwụ ọrụ ebụbe"

Bintu Bitrus, the mother of Godiya, one of the missing Chibok schoolgirls, weeps as she raises her hands along with other parents to pray for the release of their daughters kidnapped by Boko Haram jihadists, during a worship service to mark the fourth anniversay of the kidnapping at Chibok Town, Borno State, on April 14, 2018

Ebe foto si, AFP

N'atụmatụ odee anyị nke ndị ntaakụkọ si Afịrịka na-eweta, Adaobi Tricia Nwaubani sị na nne na nna ụmụ akwụkwọ na-efu na Chibok ka nwere olilanya ka afọ ise gachara kemgbe atọọrọ ha.

Obi ka na-amafụ nne na nna ụmụ akwụkwụ Chibok n'aka ihe atụghị anya, abụghị Boko Haram, nwereike nọrọ na nsogbu niile ha nwere kemgbe afọ ise gara aga atọọrọ ụmụ ha n'ụlọ akwụkwọ ha n'ọwụwa anyanwụ nke ugwu Naịjirịa.

N'ime ihe karịrị ụmụ akwụkwọ 200 atọọrọ n'ime ulọakwụkwọ ha n'ụbọchị Apreelu nke 2014, 107 alọtara site na-ịtọghapụ maọbụ nkwekọrịta gọọmentị Naịjirịa na Boko Haram nwere, ka ihe karịrị 100 ka na-efụ.

Yakubu Nkeki, bụ onyeisioche otu nne na nna ụmụ ya so n'ime ndi aka ji sị; "Onwere ihe na-achụ anyị, n'ụzọ ọbụla eji loo ya,"

Nwa nwanne Nkeki so n'ime ụmụakwụkwọ atụghapụrụ n'afọ 2017.

Adaobi Tricia Nwaubani
Adaobi Tricia Nwaubani
The threat of Boko Haram is still very real to the people of Chibok"
Adaobi Tricia Nwaubani
Writer

Mr Nkeki nwere ọtụtụ mgbawa obi oji agba akaebe ihe a ọ na-elo.

N'ọnwa Epreelu nke 2018, nne na nna ụfọdụ umụ akwụkwọ a atụghapụrụ dabanyere na mberede okporo ụzọ.

Ha nọ na njem ịga nzukọ na mahadum di na Yola ebe ụmụ ya nọ na-eme mmụta pụrụiche gọọmentị haziri.

Otu n'ime ha nwụrụ ebe ahụ ebe 17 ọzọ gara ụlọ ọgwụ maka mmerụ ahụ ha nwetere.

N'ọnwa Janụwarị nke afọ a, ụmụ nne 18 ụmụ Chibok ka na-efu na-alaghachi ụlọ akwụkwọ ha mgbe ụgbọala bu ha nwere mberede. Mmadụ asaa n'ime ha nwetere ezigbote mmerụahụ. Onye ọzọ merụrụ ahụ bụ Zannah Lawan, onye odeakwụkwọ otu nne na nna ụmụ Chibok. Lawan du umụakwa ahu aga akwụkwọ.

Ọsụkọsụ na-agbalite

N'ọnwa Maach, mgbe ụmụaka ahụ na-alaghachi akwụkwọ, Nkeki kpọ ha ga, busa ha n'ụlọakwụkwọ, mana ụgbọala ahụ oji ala nwere mberede n'ụzọ.

Ọ sị; "Ụgbọala tụgharịrị mana emerụghịm ahụ," ma sịka, "Ihe ndị a agbaghị aka."

Yana Galang, nne otu n'ime umụ akwụkwọ Chibok, ji ekwentị na-egosi foto nwa ya mgbe ya na ndị ntaakụkọ na-akpa nkata n'afọ 2016

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Rifkatu Galang, onye atọọrọ mgbe ọ dị afọ 17 n Chibok ka nọkwa n'aka ndị ntọọrị
Yana Galang
AFP
Nobody comes to us and tells us anything about the girls"
Yana Galang
Mother of Rifkatu, who is still missing
Presentational white space

MMdu 34 so n'otu nne na nna Chibok anwụọla kemgbe atọọrọ ụmụ ha ruo ugbua, site na mberede okoro ụzọ, ọrịa nakwa mwakpo Boko Haram.

Ihe ọzụ na amapụ Maazị Nkeki obi bụ esemokwu na-ada n'etiti nne na nna umu Chibok. Nzukọ ha na ejikarị esemokwu gbasaa, ka nne na nna na-achụ ịgba ibe ha ọgụ.

N'afọ gara aga, ụfọdụ nne na nna ụmụ Chibok a na-efu kwuru na ha ga-agbachi ụzọ ụgbọala bu ụmụ aka ndi atụghapụrụ laghachi Yola, na Mahadum Amerịka nke Naịjirịa, ka ha mechara ezumike. Nne na nna ndị a na-eche na ntụghapụ a atughapụru ụmụaka ndị a mere ka ewepụ yche n'ụmu ha ka no n'aka ndị Boko Haram.

"Anaghị m achọ ịkpọ ha niile na nzukọ otu mgbe," Maazị Nkeki sị.

"A na-ahọta ndi nke nwereike ige ntị ọfụma ma zie ndị ọzọ ozi."

Ka nke a na-eme, ụjọ banyere mwakpo Boko Haram ka bụ ihe ndị Chibok na-eche maka, agbanyeghi na ndị agha . Ndị ofufe alakuba na ndị Kraịst bi na Chibok.

N'izu ụka gara aga sọsọ, Boko Haram gbara obodo asaa ọkụ na mpaghara ahụ ma mebie ọtụtụ ụlọ, tumadị nke ụfọdụ ụmụ Chibok a na-agụ akwụkwọ na mahadum na Yola.

Ụfọdụ ụmụ Chibok na-agụ akwụkwụ pụrụiche na Mahum Amerịka dị na Yola

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ụfọdụ ụmụ Chibok na-agụ akwụkwụ pụrụiche na Mahum Amerịka dị na Yola

Maazi Nkeki sị, "Ihe a na-eme na Chibok jọgbụrụ onwe ya." Ọ sịkwa, "Ọtụtụ mmadụ anọghịzi na be ha."

Nne na nna Chibok na-ahụzị ntọrị ụmụ ha ka otu n'ime ajọ ihe dakwasịrị ha na obodo ha.

Ịchọ ọrụ ebube

Maka ncheta ntọrị umụaka a nke ise, ha kpebiri ịga n'ụzọ ọgwụgwọ nsọ.

T B Joshua

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, TB Joshua bụ ụkọchukwu ama ama

Na mbido ọnwa, ndị na-anọchite anya otu nne na nna Chibok gara njem karịrị elekere 48 n'okporo ụzọ site Chibok gawa Legọs, ịga hụ ụkọchukwu ama ama bụ TB Joshua.

Nwoke hibere ụlọụka akpọrọ "The Synagogue, Church of All Nations (SCOAN) na Bekee so n'ime ndị ụkọchụkwu aha ha na-ada ụda na Naịjirịa.

Puku kwa puku mmadụ na-esi ụwa dum abịa ụlọụkwa SCOAN dị na Ikotun dị na Legọs ịchọ ọrụ ebube.

Yakubu Nkeki
AFP
We decided to come to TB Joshua because we have seen him on TV and we see how he works miracles"
Yakubu Nkeki
Chairman of Chibok Parents' Association
Presentational white space

Yana Galang, otu n'ime nne na nna 12 gara SCOAN sị; "Ihe mere anyi jiri kpebie ị ga hụ ya bụ makana anyi ahụla ọrụ ministri na-ahu maka ụmụ nwaayị, gọọmentị etiti na ọtụtụ mmadụ, mana ruo oge a, enweghi akukọ maka ụmụaka no n'ọhịa."

Nwa Galang, Rifkatu, ka no na-aka Boko Haram.

"Onweghi onye bịara gwa anyi ihe ọbụla maka umụaka a. Ọ ya mere anyị jiri wetere ya Chukwu."

Ụmụ Chibok
Presentational white space

N'ime ndị so gaa Legos bụ onye nnekọta Leah Sharibu, bụ nwata dị afọ 14 so n'ime ihe karịrị umụakwụkwọ 100 ndị Boko Hatam tọọrọ n'afọ 2017 n'obodo Dapchi.

Ụfọdụ n'ime ụmụakwụkwọ atọọrọ mgbe atọọrọ Sharibu nwụrụ mgbe Boko Haram nwụchịkọrọ ha, mana atụghapụrụ ndị ọzọ ka gọọmentị Naịjirịa na ndị ji ha nwere nkwekọrịta.

A ka ji Leah, makana okweghi na ya ga-agbara ikpe ofufe Kraịst azụ site ịbụrụ onye alakuba.

Agbanyeghi nkwa gọọmentị na-ekwe maka ntụghapu nwaada a, ọ nọ n'ime ntọọrị mee ncheta afọ 15 ya.

Nne na nna ya ejighi ahụ ugbua, nke mere ha ji zipu nwanne ya ka ọ ga nọchite anya ha na nzukọ a emere n'ụka TB Joshua.

Ọnu na-ekwuru Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garba Shehu kwuru na a ka na-agba mbo ịkpọlata ndị a aka ji, mana ọgbahara di n'etiti Boko Haram so me ka ọrịa ahụ.

Ọ sị na otu n'ime Boko Haram na-akpa agwa ekwie ekwe.

Ma Nkeki kwenyere na gọọmentị agbasiela mbọ ike.

Ọ sị; "Ndị agha agbaala mbọ ha dịka ọtụtụ n'ime ha anwụọla ka ha na-achọ ụmụ anyị maọbụ ichekwa anyị."The military have tried their best and many have lost their lives while looking for our daughters or trying to protect us,"

Mana, ọsikwa na nne na nna ụmụaka chọrọ ka asaa ha ajuju ha banyere etu ihe si kwụrụ.

"Anyi kpebiri ị bịa nke TB Joshua makana anyị na-ahụ ya na TV nakwa na-ahụ etu o si eme ihe ebube ma na-enyere ndi mmadu aka. Ya bụrụ na ihe a na-eme anyi si anyi na-aka, ya pere anyi ekpere."

Presentational grey line