Chibok Girls: Anyị nwere olileanya na ụmụaka ụmụnwaanyị ndị ga-alọta - Buhari

Ebe foto si, BBC/MBuhari
Buhari kwuru na ya echọzọbeghị nkwa ya kwere ịgbapụta ụmụaka Chibok ndị Boko Haram tọrọ afo ise gara aga n'ụlọakwụkwọ ha.
Onyeisiala onye kwuru nke a site n'ọnụ na-ekwuru ya bụ Garba Shehu kwuru na uche ya ka dị na nkwa ahụ o kwere oge ọ banyere ọchịchị agba nke mbụ.

Ma kwukwa na gọọmenti na-agba mbọ iji hụ na atọhapụrụ ụmụaka ụmnwaanyị ndị e ji eji gụnyere Leah Sharibu.
Ndị otu na-agba mbọ maka ntọghapụ ụmụaka ahụ mere ngagharịwe na Legọs ta iji cheta afọ 5 kemgbe a tọrọ ụmụakwụkwọ Chibok.
Otu a kpọrọ Bring Back our Girls maọbụ BBOG na Bekee mere ngagharị iwe taa iji cheta ha.
Na foto BBC setere ha, ha yi akwa na-acha mmemme - bụ agwa eji mara ha.
Ụfọdụ n'ime ha yi ọkọlọtọ dị icheiche na ngagharị iwe ahụ.
Ọ bụ n'ụbọchị 14 nke ọnwa Eprelu afọ 2014 ka ndị Boko Haram wakporo ụlọakwụkwọ Dapchi tọrọ ụmụaka 272.
Ụlọnga ga-enwezị intaneti

Ebe foto si, Getty Images
Gịnị ka a ga-ekwu maka mkpebi ndị ọchịchị Federal Executive Council ịmapụta ijeri naịra abụọ maka itinye ozi na-aga n'ikuku a kpọrọ "digital connections" n'ụlọ mkpọrọ?
Joseph Daudu bụbu onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị ọkaiwu na Naịjirịa, gwara BBC na ọ bụ mmadụ amaghị ihe dị mkpa, makana ụlọmkpọrọ ndị dị na Naịjirịa bụ agba ochie.
Ndị agha adọọla ndị Sudan aka na ntị

Ebe foto si, Getty Images
Ọ ka na-akpọtụkwa na mba Sudan ebe ndị agha napụrụ onyeisiala ha ọchịchị na-adọ ndị na-eme ngagharịiwe aka na ntị sị na ha agaghị anabata ọgbaghara.
Otu ọnụ na-ekwuchitere ndị agha a kwuru na ha anaghị achọ ikike, kama na ndị agha ga-ahụ na ndị mba ahụ kwanyere onwe ha ugwu.
Naịjirịa ga-amata ebe ha kwụ na AFCON tata
N'abalịa ka a ga-ama ma isi Naịjirịa a ga-apụtakwa n'asọmpi Iko mba Afrịka a na-akpọ AFCON.
A ga-eme ngụpụta ebe a ga-ama ndị ga-ezute ibe na otu ha ga-anọ n'ime ya.
Ebee ka ị na-aga? Tụrụ ute gị bịa dina n'ọgbakọ BBC Igbo.com maka akụkọ bụ eziokwu ma pụkwaa iche.
Gee Nkeji ebe a
Ihe mere n'ụtụtụ.

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi International Monetary Fund bụ Christine Lagarde akpọọla gọọmenti etiti oku ka ha wepụ ego ha na-agbakwụnye iji hụ na mmanụ ụgbọala ndị ọnụ ala.
O kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ụbọchị Tọsde n'ọgbakọ ịkwalite akụnaụba nke ụlọakụ mbaụwa hiwere na Washington, dị na mba Amerịka.
Largarde kwuru na ọ bụrụ na gọọmenti mee o tu a, ọ ka e ji ego ha nwetara tinye n'ọrụ n'ahụike, agụmakwụkwọ na iwulite ihe owuwu ndị na-akwado akụnaụba.
O sị, "Anyị kwenyere na iwepụ ego a na-agbakwụnye na mmanụ bụ ihe kwesịrị ekwesị.
I lee anya. opekatampe e mefuru $5.2 million n'afọ 2015 nakwa mpụtara so ya.
Ngalaba na-ahụ maka ihe gbasara ego achọpụtala ndụ ole a kara ịzọpụta ma ọ bụụ na a na-akwụ ego ole kwesịrị maka mmanụ."
O ruola afọ ise atọrọ ụmụaka Chibok

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ọ fọrọ ụbọchị abụọ iji mee afọ ise kemgbe a tọrọ ụmụakwụkwọ Chibok, otu Bring Back our Girls ga-eme ngagharịiwe iji cheta ụmụakwụkwọ ahụ a tọọrọ.
A tọrọ ụmụakwụkwụ nwaanyị dị 272 (narị abụọ, iri asaa na abụọ) n'afọ 2014, e mecha a tọhapụ ihe dịka notu narị n'ime ha ndị e ji ndị Boko Haram eji eji gbara isi ha.
Wike asaraala Amaechi aka udo

Ebe foto si, Wike/Amaechi
Gọvanọ na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike asapela aka mmezi nyere Rotimi Amaechi dịka ụlọikpe kachasị kụchapụrụ ikpe APC ịsonye na ntuliaka na Rivas steeti
Wike kwuru na ọ ka ga-abara ndị steeti ahụ uru maọbụrụ na ha abụọ bịakọta ọnụ jịkọọ aka rụọ ọrụ maka ọganihu Rivas steeti.










