Boko Haram: Gọọmentị atụnyela mmadụ 20 na mkpọrọ

Ebe foto si, Getty Images
Ihe rụrụ mmadụ 20 bu ndị otu oyi ndụ egwu Boko Haram ga-aga mkpọrọ n'ime ọtụtụ ndị ekpere ikpe.
A mara ndị a ikpe n'ụlọịkpe ndị agha dịna Kainji nke Naịja Steetị bụ ebe a nọ kpe ikpe a.
Otu onye ngwọrọ ọrụ ya bụ inye aka tọrọ ụmụaka Chibok 200 na 2014 so n'ime ndị ga-aga ụlọ mkpọrọ afọ 15.

Ebe foto si, Getty Images
Nke a bụ mbụ a na-ama onye aka sọ na ntọro ụmuakwụkwọ Chibok ikpe.
Ụlọikpe a tọhapụrụ mmadụ abụọ n'ime ndị a maka enweghi ihe a ga-eji ma ha ikpe.
Gọọmentị Naịjirịa si na ha ji ihe karịrị mmadụ puku 6 bu ndị eche na ha bu ndị Boko Haram na ebe di icheiche na Naijirịa.
Na Ọktoba 2017, ha tụrụ mmadụ 45 mkpọrọ afọ 31.





