Anambra Funeral Ban: Gbuoro onye ị hụrụ n'anya ehi 10 ma ị chọọ - APAMS

Ebe foto si, APAMSLIMITED
Kelvin Chukwumaobi bụ onye nwe ụlọọrụ na-ahụ maka akwamozu pụrụiche gwara BBC na ahụmihe mmadụ niile dị iche.
Chukwumaobi a ma dịka Apams kwuru na o nweghi ihe ọjọọ dị na mmadụ imefu ego iji kwanyere nne ya maọbụ nna ya ugwu ikpeazụ.
Mazi Chukwumaobi kwukwara na tupu mmadụ emee ihe na ọ ga-ele akpa ya anya mara ma ọ na-agwa ya eziokwu.

Ebe foto si, Apams Limited
"Ihe gbasara akwamozu erughi ihe a ga-eji manye iwu" ka o kwuru.
Chukwumaobi ji imanye iwu gbasara udịrị akpụkpọụkwụ a ga-eyi n'ụlọomeiwu were maa atụ.

Ebe foto si, Apams Limited
Cheta na ndị ụlọomeiwu Anambara steeti manyere iwu ga-amachi oke mmemme nakwa mmefu ego n'akwamozu ọbụla.
Pete Ibida so na ndị binyere aka n'iwu a gwara BBC na ihe ejiri mee nke a bụ iji tụgharịa echiche ndị Igbo gbasara akwamozu.
"Ndị be anyị na-ewezi akwamozu ka mmemme dịka ekeresimesi, ụfọdụ na-ere ala iji kwaa ozu" ka o kwuru.
O kwukwara na ụfọdụ ụmụaka na-ahapụ nne ha na nna ha n'ụbịam, ha nwụzịa he ewee bido ịgosi ọgaranya n'akwamozu ha.
Akụkọ ga-amasị gị:










