Akwamozu ụmụejima jikọrọ ọnụ

Otu onye bụbu onyeisiala mba Tanzania bụ Jakaya Kikwete na ndị mịnista isii ekwuola na ha ga-aga mmemme akwamozu ụmụejima jikọrọ ọnụ a ma ama na mba ahụ taa bụ Maria na Consolata.
Ụmụejima nwụrụ ụbọchị Satọde site na nsogbu obi.
A ga-ebu ha n'otu agbati ma likwa ha n'otu ili n'ebe a na- eli ozu a kpọrọ Tosamaganga dị n' Iringa, ọdịda-anyanwụ Tanzania dịka a ga-eji obe abụọ were soro ozu ha gaa.
Maria na Consolata Mwakikuti ndị jikọrọ bido na utube gbada nwerịtara otu imeju, akpaụme (lungs) mana ha nwere mkpụrụobi, abụọ, isi na aka dị iche iche.





