Ejima atọ anwụọla na Jigawa Steeti

Ebe foto si, Getty Images
Onye na-ekwuchite ọnụ ngalaba na-ahụ maka nchekwa a na-akpọ NSCDC bụ Adamu Shehu kwuru na nke a mere n'obodo Hadejia na Jigawa.
Ọ gwara ndị ntaakụkọ News Agency of Nigeria na ihe kpatara ọkụ a bụ mgbe ọkụ latrik bidoro igba n'igwe eji esi mmiri ọkụ, ma ọkụ ahụ malitere ịgba mgbe oji nkeji iri anọ n'ise gafee elekere iri nke abanyị
Aha umu nwanne ahụ nwụrụ bụ Hassan, Hussain na Muhsin Sale.
Nwanne ha nwoke bụkwa Aliyu Sale nwụkwara.
Shehụ si na ọkụ nke a bidoro n'ụlọ nke ejima atọọ a, were gbakwa ịhe ndị ọzọ dị na gbụrụgbụrụ ebe ahụ.
Ọ dọkwara aka na ntị si ndị mmadụ kpachara anya na ịhe ndị latrik karịcha oge ụgụrụ a.





