Taa bụ afọ anọ atọọrọ ụmụakwụkwọ Chibok
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Taa bụ ncheta afọ anọ atọọrọ ụmụakwụkwọ Chibok
N'ụbọchi taa, Naịjirịa na otu dị iche iche na mba ụwa niile dịka UNICEF, BBOG na-echeta afọ anọ atọrọ ụmụ akwụkwọ Chibok dị narị abụọ na iri asaa na isii.
Cheta n'abalị iri na anọ nke ọnwa Epurelu n'afọ 2014 ka ndị Boko Haram tọọrọ ụmụaka ndị a n'ụlọ akwụkwọ ha dị na Chibok nke Borno Steeti.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Afara Ukwu Ibeku, Abia Steeti Ahụbeghị onye Eze ha
Praịm mịnịsta ọdịnala nke Ụmụobasi,Isiama Afara Ukwu bụ Chiemelam Odoemelam etiela na mkpu na ndị obodo ha ahụbeghị onye Eze ha bụ Isreal Okwu Kanu nna onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu.
Ọ rịọrọ ka ndị ji ya na ezinaụlọ ya kpọpụta onye Eze ha ma ọ dị ndụ ma ọ ọnwụrụ anwụ

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Mba Amerịka, Uk na Fransị atụọla ogbunigwe na mba Sirịa
Mba Amerịka , United Kingdom na Fransị agbakọtala aka ọnụ tụọ ogbunigwe n'ụlọọrụ ebe a na-eme ngwaagha kemịkal na mba Sirịa, maka mwakpo ha jiri ngwaagha ahụ mee n'obodo Douma.
Ogbunigwe a gbara n'isi obodo Sirịa bụ Damascus, nakwa obodo abụọ ọzọ dị na mpaghara Homs.

Ebe foto si, AFP
N'egwuregwu
N'abalị ụnyaahụ, ụmụ afọ Naịjirịa zakọọrọ nrite ọlaedo anọ nke mere ya ọlaedo asatọ ha nwetarala n'egwuregwu commonwealth.
Naịjirịa bụ ndị abụọ kachasị enweta ihe nrite na Afrịka ma agụpụ mba Saụt Afrịka.

Ebe foto si, Getty Images
Nkeji nke mgbede a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.
Ihe onyonyo taa
Ihe onyonyo a gosiri ahụhụ ndị ụmụaka bụ ụmụ ndị China na-ata na Ghana.











