Ọgụ Sirịa: Ngwaagha kemịkal egbuola ọtụtụ ndị mmadụ

Ebe foto si, Getty Images
Donald Trump katọrọ onyeisiala mba Sirịa bụ Bashar al-Assad nakwa ndị ogbo ya nke Rọshịa na Ịran maka ebubo mwakpo ngwaagha kemịkal, kwuo "na ha ga-akwụ oke ụgwọ maka ya".
Akụkọ ndị ahụike kwuru na-egburu ọtụtụ ndị na mwakpo e mere na satọde n'obodo Douma bụ ebe ndị agha nnupuisi kpachiri.
Mba UK kpọrọ oku ka-emee nyocha ngwangwa, ebe Onyeisi ndị ụka Katọlịc bụ Poopu Francis kwuru na onweghị ihe kpatara iji ngwaagha kemịkal eme mwakpo.
Mba Sirịa na Rọshịa agọnahụla na aka ha dị na mwakpo ahụ.
N'ozi Trump wepụtara n'akara tuwita, ọ kọwara onyeisiala Assad dịka "anụmanụ".
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2
Mkparịta ụka mba Rọshịa na ndị agha nnupuisi ahụ bụ Jaish al-Islam gbasasịrị, ebe ọgụ malitere.
Mana akụkọ mba Sirịa wepụtara kwuru na nkwekọrịta ha na ndị Jaish al-Islam bụ ka ha si n'obodo Douma pụọ n'ime ụbọchị abụọ, iji tọhapụ ndị otu ha nọ na mkpọrọ.
Ndị agha nnupuisi a ekwubeghị okwu.
Douma bụ obodo ndị agha nnupuisi ka fọrọ na mpaghara Ghouta nọ na mpụta isi obodo Damascus kamgbe ndị gọọmenti malitere ibuso ha agha nakwa nkwerikọta nke ndị mba Rọshịa hiwere.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: