Russia: Mmadụ 23 ndị ọrụ UK ka Moscow chụpụrụ

Ebe foto si, Getty Images
Mba Russia ekwuola na ha ga-achụla ndị ọrụ na-ahụ maka mmekọrịta mba Britain na ndị ọzọ mmadụ iri abụọ na atọ dịka nsogbu dị n'etiti mba abụọ ahụ na-aga n'ihu maka mwakpo a wakporo otu onye nyocha nzuzo nke mba Russia na nwa ya na UK.
Ụlọọrụ mba Russia na-ahụ maka mmekọrịta ndị mba ofesi ekwuola na ndị ọrụ mba Britain ahụ nọ n'isi obodo Russia bụ Moscow ga-ala n'otu izuụka.
Ha kwukwara na ha ga-emechi ụlọọrụ ndị Britain bụ ebe ha na Russia sị ekekọrịta omenaala na ejije, ya na ebe ndị mba Britain bi na Russia dị na St Pitasbug.
Nke a bụ ịzaghachi mba Britain maka ndị ọrụ Russia mmadụ iri abụọ na atọ Britain chụlara.
Britain nyere iwu ka ha laa maka ihe ahụ mere ụbọchị anọ ọnwa a bụ Maachị nke gọọmenti UK na-ata gọọmenti Russia ụta mana Russia gọnarịrị ihe ọjọ ọbụla.
Ụlọọrụ UK na-ahụ maka mmekọrịta ndị mba kwuru na ha tụrụ anya ihe a Russia mere mana ndị ọrụ nchekwa dị n'aka ga-enwe ọgbakọ n'izu na-abịa ka ha mara ihe ha ga-eme ọzọ.
N'akwụkwọ ha dere, ha kwuru: "Ihe Russia mere agbanweghị na chọrọ igbu mmadụ abụọ n'ala UK nke a na-enweghi okwu ọzọ na-abụghị na mba Russia ka ikpe mara."
Onye nyocha nzuzo ahụ bụ Sergei Skripal na nwa ya nwaanyị bụ Yulia Skripal ka nọ n'ụlọ ọgwụ dịka a hụrụ ha n'oche na Salisbury ebe ha amaghị onwe ha.

Ebe foto si, EPA/YULIA SKRIPAL/FACEBOOK
Ụbọchị Fraide, onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mmekọrịta UK na mba ndị ọzọ bụ Boris Johnson kwuru na "ihe niile na-atụ aka" na ọ ga-abụ aka na-achị mba Russia bụ Vladamir Putin nyere iwu ka a wakpoo mmadụ abụọ ahụ.
Na ịzaghachị, onye nkwuchiteọnụ Putin bụ Dmitry Peskov kwuru na ebubo ahụ tụrụ ha n'anya ma na ha agaghị agbagha ya.
Nke a niile na-abịa dịka ndị mba Russia na-akwadọ ime ntuliaka onyeisiala.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










