Border Closure: Ihe 10 Naịjirịa nwereike ịmepụta a ka na-esi mba ọzọ atụbata

Ebe foto si, Getty Images
Dịka gọọmenti etiti wepụtachara ihe ndị ga-eme ka ha agbape 'bọda', anyị na-ewepụta ihe iri Naịjirịa ka na-atụbata mana ha nwereike emepụtali na bee ha.
Ha karịrị iri mana anyị ga-agbado ụkwụ na nanị iri.
Nke mbụ bụ azụ okporoko

Ebe foto si, Getty Images
Naịjirịa nwere azụ dị icheiche mana ndị mmadụ ka na-ajụ ihe na-atọ ha iche n'okporoko tụmadị isi ya.
Naanị n'ọnwa 2017 ka mba Norway depụtara na Naịjirịa zụrụ ha ahịa ruru nde iri ise n'ụma nke mere ka ọ bụrụ mba kachasị atụbata azụ na mba ụwa niile.
Nke abụọ bụ okpu nnabuenyi nke akpọrọ Kondom n'asụsụ bekee

Ebe foto si, Getty Images
Society for Family Health Nigeria kwuru na ndị Naịjirịa na-eji ihe ruru Kondom nde narị anọ(400million) eme ihe kwa afọ.
Mana mgbe onyeisi ngalaba ahụ bụ Bright Ekweremadu kwuputechara ọnụ ọgụ a, ndị mmadụ kwuru na o nwereike ịkarị ole ahụ.
Nke atọ bụ ntutu ụmụnwaanyị

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ụmụnwaanyị ka ọ na-amasị ikpu ntutu ndị ọcha n'isi ha.
A na-esicha China , India nakwa Peru atụbata ya bụ ntutu na Naịjirịa.
Nke anọ bụ nkpapụta eze

Ebe foto si, Getty Images
National Bureau of Statistics na-ekwu na Naịjirịa mefuru ego ruru naira nde iri na otu na ụma(N11.46m) n'afọ 2016.
Agbanyeghị na gọọmenti etiti akachapụchala ya na ụfọdụ ihe eji ego ofesi azụta , ndị mmadụ ka na atụbata ya.
Gọọmenti etiti na-ekwusi ike na a ga-emepụtali ya bụ npkafụta eze na Naịjirịa.
Nke ise bụ mmanụ nri na mmanụ ọpụpa

Ebe foto si, Getty Images
Nke isi bụ ude na ncha

Ebe foto si, David Cooper
Nke asaa bụ peteri na akpa ara.

Ebe foto si, Getty Images
Nke asatọ bụ kọmpụta na ekwenti

Nke itoolu bụ akwa a na-eyi n'ahụ

Nke iri bụ ụgbọala

Ebe foto si, Innoson twitter
Mana etu a emechirila oke ala, ndị mmadụ na-ele anya ịhụ ka ụmụ Naịjirịa bido rụpụtawa ụmụ ihe a na-atụbata n'obodo a enwereike ịrụpụtalị na ya.









