Insurance in Nigeria: Uru dị n'ikpuchi azụmaahịa gị maka ọdachi

Ndị na-azụ ahịa

Igbo tụrụ ilu sị 'Agha a gbara ama ya, a dịghị eri nwa ngwọrọ', nke a bụ ka ọ dị n'ihe banyere ikpuchi akụnaụba (Insurance) mmadụ maka ọdachi.

Akụkọ a kọwara uru dị nakwa usoro onye azụmaahịa ọbụla nwereike iji chekwaa ngwaahịa ya maka ọdachi ndị gụnyere ọkụ ọgbụgba, mmiri oriri maọbụ izu ya n'ohi.

Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ngwaahịa ndị mmadụ lara n'iyi n'ọkụ gbara n'ahịa Ọchanja, Ọnịcha n'izuụka gara aga.

Otu onye ọkacha n'okwu banyere ikpuchi akụnaụba bụ Golden Akukwe, kọwara uru ndị a ma nye ntuziaka etu e si eme nke a.

Ọ sị na uru gbara ọkpụrụkpụ dị na mmadụ ikpuchi azụmaahịa ya bụ na ụlọorụ na-ahụ maka nke a (insurance company) ga-akwụghachị ya ụgwọ ngwaahịa ndị ahụ ma ọ bụrụ na ihe mee ha.

Ebe ọkụ ka na-agba

O nyere ndị na-achụntaego ndụmọdụ ka ha gbalịa kpuchie ngwaahịa ha maka 'ihe Ọnịcha gwara Obosi'.

Akukwe sị na ọ hụbeghi ọghọm dị na mmadụ ikpuchi ngwaahịa ya ma ọ bụrụ na onye ahụ mere ya n'ụzọ ziri ezi.

Kedụ usoro mmadụ ga-eji kpuchie azụmaahịa ya?

Golden Akukwe

Ebe foto si, Golden Akukwe/Facebook

Nkọwa foto, Golden Akukwe onye ọkacha n'okwu ikpuchi akụnaụba (Risk Manager)

Akukwe kọwara ụzọ onye azụmaahịa nwereike iji kpuchie ngwaahịa ya maka ọdachi.

Ọ sị na onye ahụ ga-eme ihe ndị a;

  • Ọ ga-agba mbọ hụ na ngwaahịa ya tozuru oke maka ịnata mkpuchi n'aka ụlọọrụ na-ahụ maka mkpuchi akụnaụba (Insurance Company).
  • Gaa kpọtụrụ ndị ụlọọrụ na-ahụ maka mkpuchi, kọwaara ha ụdị nke ị chọrọ.
  • Ha ga-abịa n'ụlọahịa onye ahụ ma mee nyocha ịmata ego ole ngwaahịa gị niile pụtara.
  • Ụlọọrụ ahụ na onye ahụ ga-etinye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta iji kwado mkpuchi ngwaahịa ndị a.
  • Site mgbe ahụ gawa n'ihu, ụlọọrụ a ga-akwụ ụgwọ ngwaahịa ahụ ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọbụla mere ngwaahịa onye ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Onitsha fire: "Ụlọ m na 'shọp' m gbara ọkụ, ebe ka m ga-agbaje?