Anambra fire: Ọkụ agbagbuola mmadụ atọ na Nnewi

Mmadụ atọ na-arụ n'otu ụlọ oriri na nkwari dị n'obodo Akwudo dị n'Otolo, Nnewi dị n'Anambara steeti anwụọla dịka ọkụ gbara ebe ahụ n'isi ụtụtụ taa.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed, gwara BBC Igbo na ndị uweojii nwụchiri onye nwe ebe ahụ maka ebubo na ọ na-agbachikarị ndị na-arụrụ ya ọrụ ma ha laba ụra n'ime ebe ahụ.
Ọkụ ka na-agba n'Ọchanja

Akụkọ si Ọnịcha eru anyị ntị na-akọwa na ọkụ tanka ahụ gbara n'ahịa Ọchanja ụbọchị atọ gara aga, ka na-enwu ruo ugbua.
Ndị ihe ha lara n'iyi na ya bụ ọkụ ọgbụgba ka na-ekele Chukwu maka ndụ ha ma na-enwe olileanya.
Ọnọdụ Brexit nọ ugbua

Ebe foto si, UK Parliament/Jessica Taylor
Enwebeghi ebe mba Briten ji azụ aga n'ihe gbasara okwu ọpụpụ ha bụ Brexit.
Ndị ụlọomeiwu mba ha mere ntuliaka taa ebe ha kpebiri ka e chetukwuo obere tupu e mee ntuliaka ọzọ n'izu na-abịa, gbasara ọpụpụ ha nke Boris Johnson chọrọ.
N'egwuregwu,
Chelsea mechara gbara isi onwe ha n'aka ndị otu egwuregwu Newcastle dịka Marcos Alonso ji goolu dọrie poostu na nkeji iri asaa na atọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Tottenham na onwe ha azanwughị aha nna ha ka ndị Watford ji otu goolu gwọọ ha ịba nke ga-eme ya ugboro abụọ na-eso ibe ya ha emeribeghi bọọlụ.
'Enweghị ntiwapụ ọrịa Monkeypox na Naijirịa' - NCDC

Ebe foto si, Getty Images
Dika ụfọdụ akwụkwọ akụkọ na-ekwu na ọrịa akpọrọ 'Monkey Pox' etiwapụla n'ụfọdụ steeti na Naijirịa, ngalaba na-ahụ maka ọrịa bụ Nigeria Centre for diseaase Control (NCDC) apụtala sị na 'E nweghị ọrịa monkey pox na steeti ndị a ma na Naijirịa niile'.
Nke a sitere n'ozi Jeremiah Agenyi detara ndị BBC ebe ha kwuru na akụkọ na-ekwu na ọrịa Monkeypox etiwapụla na Legọs, Rivas na Akwa Ịbọm steeti bụ asi.
Ha kwuru na kamgbe afọ 2017, na ha na enweta mgbesa maka ọrịa Monkeypox kwa izuụka n'otụtụ steeti dị na Naijiria.

Ebe foto si, @NCDCgov
NCDC kwuru na ha na-gba mbọ ichọpụta ọria a n'oge ma zigakwa ndị gbatagbata ha na steeti ọwụla achọpụtara ya bụ ọria.
Ha kwụkwara na site na Jenụarị ruo onwa Sepụtemba 2019, na ha enwetela mkpesa maka ọrịa monkeypox na steeti itolu na Naijirịa.
Akwụkwo a kọwara na n'ime mkpesa iri asatọ na otu, ọ bu iri atọ na itolu bụ ọria monkeypox.
Ha kwukwara na ọ bụ nanị otu onye nwuru site n'aka ọrịa n'ime mmadụ iri atọ na itolu.
Ha rịọkwara ka ndị mmadụ gaa na websaịt ha ebe ha na-ebipụta akwụkwọ izuụka ọbụla maka ọrịa dị iche iche ka ndị mmadụ mara nke ekwe na-akụ. (Lekwa ya ebe a Monkey Pox)
NCDC kwuru na na-agbanyeghị na enwere ọrịa a n'ụfọdụ steeti, kama ha amabeghi ọkwa maka na orubeghị nke ntiwapụl.
'Anyi gbụrụ otu onye ntọ' - Ndịagha Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Ndiagha Naijiria ndi nke 'Operation Thunder strike' egbuola otu onye ha siri bụ onye ntọrọ ma zọpụta kwa mmadụ atọ atọro n'okporo ụzọ Abuja-Kaduna.
Ọnụ na-ekwuchitere ndịagha bụ Ezindu Idimah kwuru na agbagburu onye ntọ a mgbe ha na ndịagha zutere ebe ụfọdụ ndị otu ya bu mgbọ egbe n'ahụ ha gbafuo.
'A ga-enyocha NDDC' - Muhammadu Buhari
Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari enyela iwu ka enyocha ọrụ niile ngalaba Niger Delta Develpment Commission' rụrụ site n'afọ 2001 ruo 2019.
Nke a na-abia dịka ndị mmadu na akatọ etu ngalaba a si arụ ọrụ ebe Buhari si na ọrọ ngalaba a rụrụ egosaighi nkwado niile gọọmentị etiti nyere ha.
N'Ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Mexico bụ Andres Obrador ekwuola si ee na ha tọhapụrụ Ovidio Guzman bụ ọpara onyeisi ndị ọgwọike Sinolao Cartel eji El chapo mara.
Obrador kwuru na ndị nchekwa nwụchirị ya ma hapu ya mgbe ndị otu ya lụsoro ha ọgụ ma wakpo ha.
N'Egwuregwu

Ebe foto si, @NGSuperEagles
Ndị otu egwu bọọlu super Eagles nke bi na Naijiria ga-ezute ndị nke Togo na Legos taa bụ 19th Novemba maka agba nke abụọ maka ntozu asọmpị Afrịcan Nations Championship nke a ga-agba na Cameroun.
Cheta na ndi otu Togo ji goolu anọ asatara otu were merie ndị Super Eagles na be ha, kama ndị super Eagles na-agwa ndị Naijiria na ha ga emeri Togo .










