Enugu Airport: 'Ọrụ ga-amalite n'ọdọụgbọelụ Akanu Ibiam mgbe adịghị anya' - Onyeisi na FAAN

Otu n'ime ndị isi n'ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ ụgbụọelụ bụ Federal Airports Authority of Nigeria nke akpọrọ FAAN na aha ịchafụ agbarala BBC ama ndị mmụọ.
Nwaamadị a gbaara anyị ama a na-achọghị ka akpọ aha ya sị na ugbua onyeisiala nyegoro ikike ka ewepụta ijieri naịra iri tinye na ya bụ ọrụ, na oge eruola mgbe ha ga-amalite ya bụ ọrụ n'ikem n'ikem.

BBC jụrụ ya ma ya bụ ego onyeisiala Muhammadu Buhari mapụtara ọ ga-ezu ya bụ ọrụ, ọ sara na ọ bụ ego ha tinyere ka onyeisiala nyere ha.
Ọ sịkwa na ihe bụ ọkpụrụkpụ ọrụ dị na ya bụ akwụkwọ ha depụtara maka ya bụ ọrụ bụ ihe gbasara irụgharị okporoụzọ ụgbọelụ Akanu Ibiam ya na ọrụ ndị ọzọ na-erijughị afọ.
O kwetere na ya bụ ego gọọmenti tinyere aka na ya ga-ezu ya bụ ọrụ.
Ya bụ nwaamadị kwuru na obi ụtọ ya bụ na mmiri ozizo akwụsịwala nke bụ na ha nwere ike ịmalite ya bụ ọrụ tupu abali iri agachaa.
Ọnwere okwukwe na ha ka ga-arụcha ya bụ ọrụ tupu Ekeresimesi etinye ukwu.






