Enugu Airport Closure: Mmechi ọdọụgbọelụ akụọlara ndịọrụ ọrụ

Ndịọrụ ụgbọelu na-arụ n'ọdọụgbọelụ Akanụ Ibiam dị n'Enugwu na-akpọkụ gọomenti etiti ka ha mee ngwangwa ịrụzi ya bụ ọdọugbelu e mechiri kamgbe ọnwa Ọgọstụ afọ a.
Ndị a BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ndị niile na-akpata ihe ha na ezinụlọ ha na-eri n'ọdọụgbụelụ ahụ tipịara etipịa ugbua.
Agu Joseph bụ onye ọrụ Arik Airline sị na ihe na-efulahụ ha maka ya bụ mmechi karịrị akarị.
Ọ sị na ego kwesiri ịbatara ụlọorụ ahụ sịte na ndị na-aga Enugwu anaghịzị abata.
Joseph kwuru na a bụghị ya ka ọ dịịrị ikwu ego ole na-efulahụ ụlọọrụ ha maka ya bụ mmechi.
Onye ọzọ na-arụrụ Azman Air ọrụ bụ Benjamin Aluya Agboga sị na mmechị ya bụ ọdọụgbụelụ tinyere ha na nnukwu gbagharịa.
Agboga kwuru na ha na-agazị Asaba nakwa Owere iji gotere ndị ahịa ha akwụkwọ eji agba ụgbọelu.
Ọ sị na ahụhụ dị na ya karịrị akarị nke bụ na ihe na abatara aha erughị ka ahụhụ ha na-ata.
Agboga kwurukwara na-agbanyeghị na e kwere ha nkwa na a ga-arụcha ya bụ ọrụ n'ọnwa Disemba, mana ọrụ amalitebeghị ebe ahụ nke taa.
Mmadụ abụọ a kwetekwara na ọ ka mma imechi ya bụ ọdọụgbụelụ karịa na a hapụrụ ya ka ọ meruo mmadụ ahụ.
Kama ha rịọrịọ gọọmenti etiti ka ha bịa mezie ya bụ ọdọụgbọelu dịka ha kwere na nkwa.
Akụkọ ga-amasị gị:











