Enugu Airport: A rụchala ọdọụgbọelu Akanu Ibiam

- Onye dere ya, Ebere Ekeopara
- Ndị mere akụkọ a, Reporter, Igbo Service
Minister na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika ekwuola na ụbọchị 30 nke ọnwa Ọgọstụ ka a ga-emepa Akanu Ibiam Int'l Airport, Enugwu a lụgharịrị ọhụrụ.
Sirika kwuru nke a oge ọ bịara njem nleta ka ọrụ si aga na ya bụ ebe.
Cheta na ọ bụ ihe dịka ọnwa asatọ gara aga ka a malịtere ọrụ n'ọdọụgbọelu ahụ.
O kwukwara na na otu nwoke aha ya bụ JJ Emejulu ga-enweta ntaramahụhụ gọọmenti n'ihi na o gara kutuo ngwuru gọọmenti, ebe ha dobere maka ịrụ 'Free Trade zone' n'akụkụ ọdọụgbọelu ahụ.

Emejulu kwuru na gọmenti naara ya na ọtụtụ mmadụ ala ha ma kutuo ụlọ ndị mmadụ na enweghi ego iti aka n'obi ọbụla.

Mazi Hadi Sirika gọmenti etiti adịla njikere ịdọnyere gọmenti Enugwu ukwu iji kpochapụ ihe ọbụla ga abụ ọgbatauhie na ọrụ airport ahụ.
Sirika na onye ọnọchite anya gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi nakwa ndị ọrụ nchekwa dị iche iche gagharịrị gburu gburu Akanụ Ibiam Int'l Airport Enugwu.
Ọrụ amalitebeghi n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu

Otu n'ime ndịisi na ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu a kpọrọ 'Federal Airport Authority of Nigeria' gbaara BBC Igbo izu nke a n'ụbọchị ụka, abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Septemba.
Mana o kwuru ka a ghara ịkpọ aha ya n'ihi na enyeghị ya ikike ịgwa ndị ntaakụkọ okwu.
BBC kpọtụrụ onye a n'ihi akụkọ ọtụtụ ụlọọrụ ntaakụkọ dị icheiche dere na-ekwu na ọrụ a malitela na ọdọụgbọelu ahụ.
Ma ọ gwara anyị na ngalaba Faan emechaala nchọpụta na nkwado niile ha ga-eme gbasara ọrụ ahụ.
N'okwu ya: "Nke fọrọ afọ ugbua dịịrị mịnịstrị nke okwu njem ụgbọelu dị n'aka a kpọrọ 'Ministry of Aviation'.
Mịnịsta na-elekọta ya bụ ngalaba bụ Hadi Sirika.

Ebe foto si, facebook.com/femi.adesina
Cheta na gọọmentị etiti mechiri ọdọụgbọelu Enugwu n'ọnwa gara aga iji wee ruzie ụzọ ya.
Mana kamgbe ahụ ọrụ amalitebeghị na ya bụ ebe.
Nke a mere ka ndị mmadụ na-ajụ mgbe ọrụ ga-ebo na ya bụ ọdọụgbọelu.
Ndị gọvanọ ala Igbo tinyere ọnụ n'okwu ahụ wee gwa ndị mmadụ ha akụjala akụja maka na a ga-emepe ya bụ ọdọụgbọelu tupu emume ekeresimesi eruo.
Onyeisi otu jịkọrọ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ bụ Dave Umahi kwuru na ya na onyeisiala Buharị kpara maka ọdọụgbọelu ahụ mgbe ha nwere nzukọ n'ọdịnso a.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:










