Leicester City vs Newcastle United: Newcastle United siri bọọlụ bọọlụ taa n'ọgbọegwuregwu

Andy Carrol na Ricardo

Ebe foto si, Alamy

Nkọwa foto, Andy Carroll nke Newcastle United tinyeere Ricardo Pereira nke Leicester City ọkpa

Newcastle United gara ọrịrị na King Power statuim taa ebe Leicester City ji ọkpụrụkpụ goolu ise asataghị ihe meere ha ọjị.

Nwaafọ Igbo bụ Wilfried Ndidi sokwa gbaa aka ahịa taa.

Nke a bụ ugboro anọ Newcastle United achịtaghị aja n'asọmpi kemgbe amiltere Premia Lig nke afọ a.

Mbọ niile ha gbara lara ha n'iyi nke bụ na ha gbatakwuru akwụkwọ mmeemmee nke mere ka achụpụ Isaac Hayden ebe ọ na esi ọnwụ ịnye goolu na nkeji nke 43.

Mgbe ahụ ka ịhe bidoziri tawara Newcastle nke bụ akpụ maka na ha dịzị mmadụ iri agba ya bụ bọolụ.

N'otu aka ahụ ka e sị nyekwa onye otu ha ọzọ bụ Fabian Schar akwụkwọ nke ịdọ aka na ntị na nkeji 88 mgbe egwuregwu ahụ chọwara ịgwụ.

Wilfried Ndidi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Wilfried Ndidi sokwa gbaa aka ahịa.

Ricardo Perira nke Leicester City ji nkeji iri na isii gbaa aka ahịa ụtụtụ mgbe ọ kpara ọtụtụ mmadụ n'otu ahịrị were tinye ya bụ bọọlụ na mmpịọ New castle.

Jamie Vardy tinyere goolu abụọ na nkeji 54 nakwa nkeji 64 ka a lọtachara ezumike.

Paul Dummett nke Leicester zakwara aha ya na nkeji 57.

Mana nwaafọ Igbo bụ Wilfred Ndidi ji goolu nke ịkpeazụ meere Newcastle mmezi na nkeji 90 ka asọmpi ahụ kụụrụ ọnụ.

Akụkọ ga-amasị gị