Julius Agwu: Amataghị m nwunye m na ụmụ m ka m si 'coma' teta

Ebe foto si, Chukwunaeme Obiejesi
- Onye dere ya, Chris Sanctus Okereke
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Onye e ji emume ịkpa ụkaọchị mara bụ Julius Agwu bịara na "Gịnị n'afịọ" bụ emụme nkiri puruiche nke BBC Igbo na-eme na Fraịde ụbọchị iri abụọ na asaa na Septemba nke afọ 2019.
Julius kwuru ọtụtụ okwu gbasara ahụike ya bụ nke ọ ka na agbake na ya.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Ọ sị n'afọ 2016, ka ọ fọrọ abalị abụọ ka ya gaa ihe ngosi ịkpa ụkaọchị o nwere na London ka uche ya furu.
Ebe ya nweteziri onwe ya bụ n'ụlọọgwụ bụ ebe ya nọrọ izuụka abụọ tupu ya amata onwe ya.
Mgbe ọ tetere na ya bụ ụra ọnwụ, ọ mataghịzị nwunye ya bụ onye nọ n'akụkụ akwa ọrịa ya.
Ọ sị na awara ya akpụ n'isi tupu ya bụ ọrịa abịa.
Julius ka na-agbake na ya bụ ọrịa dịka ọ maliterela ọrụ ejije ya.
Ọ kelere ndị niile kpeere ya ekpere mere o ji gbakee.
Akụkọ ọzọ ga-amasị gị
Ihe nkiri ga-amasị gị:










