Chelsea vs Leicester: Lampard ahụbeghịkwa ụkwụ ya

Wilfried nyerela ndị Leicester goolu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Wilfried Ndidi gburu ndí otu ya ma zọkwaa ha

Olileanya ndị otu egwu Chelsea inweta mmeri nke mbụ ha n'asọmpi "English Premier League" nke afọ 2019/2020 akụọla afọ n'ala ọzọ.

Nke a mere dịka ha na ndị otu Leicester City nyere onwe ha otu ọkpụ goolụ otu ọkpụ goolu n'ụbọchị Sọnde.

Frank Lampard ka na-atụkwa anya mgbe ọ ga-enweta mmeri mbụ ya dịka onye nkuzi bọọlụ ndị Chelsea.

Mana ndị ma nke a na-akọ n'eguregwu bọọlụ na-ekwu na chi ka bụ ụtụtụ.

Ndị nkwado Chelsea sịrị Lampard nnọọ n'ụzọ pụrụ iche.

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ndị nkwado Chelsea sịrị Lampard nnọọ n'ụzọ pụrụ iche.

Nwaafọ Igbo bụ Wilfried Ndidi bụ ya gburu ndị Leicester ma zọọkwa ha.

Ọ bụ Ndịdị nyụrụ ihe na-esi mgbe Mason Mount nachaara ya bọọlụ were nye goolu mbụ ya na nkeji asaa.

Ngolo Kante na Wilfred Ndidi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ị ga-eji Wilfred Ndidi tụnyere Ngolo Kante?

Mana nke ahụ emeghi ka obi daa Ndidi mba.

Nwa amadị a gbalịrị ma saa goolu ahụ na nkeji iri isii na asaa.

Otu abụọ a gbalịrị ike ha ịma onye ga-eturu ugo na asọmpị nke taa mana mbọ ha nịịle dị ka mmiri a na-agba n'okpokoro azụ mbe.

Ebe a kwụ n'EPL

Otu ihe si gbata kwụrụ ugbua, Liverpool bụ ndị mbụ na tebulu EPL, ebe Arsenal na esote ha.

Ha abụọ enwetala akara isii akara isii dịka ha meriri asọmpi abụọ ha.

Manchester City na Tottenham nwere akara anọ anọ, ebe Chelsea nwere naanị otu.

Manchester United ga-ezute ndị Wolverhampton Wanderers na mgbede Mọnde.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: