Man United vs Chelsea: Ikuku ekuola a hụ otele Chelsea

Ebe foto si, Getty Images
Eke niile bụ eke mana e nwere eke nwe ọhịa.
Otu egwuregwu bọolụ Manchester United mere ka ndị Chelsea mata nke a oge ha jị ọkpụ goolu anọ chara acha nyụọ ha ịkpakwụ.
Nke a bụ nzute mbụ Ole Gunnar Solksjaer na Frank Lampard na-ezute onwe ha dịka ndị nkụzi bọọlụ.
Nke a bụkwa asọmpị mbụ nke Lampard na-agba dịka onye nkụzi na 'English Premier League'.
Mana Solksjaer sịrị ya nnọo n'ụzọ pụrụ iche.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Agbanyeghi na Romelu Lukaku bụ onye onyee goolu ndị Man Utd apụọla, nsogbu ọbụla adịghịrị ha n'eguregwu nke taa.
Marcus Rashford nyere goolu nke mbụ site na penariti, mgbe Zuma gbaturu ya.
Anthony Martial mezuru ya abụọ n'agba nke abụọ, ebe Rashford nyekwara goolu ọzọ.

Ebe foto si, Reuters
Daniel James, bụ onye Man Utd zụtara ọhụrụ, nyere goolu mbụ ya iji gosi na ọbịaghị ilegharị anya.
Harry Maguire na Aaron Wan Bissaka gosikwara ihe kpatara Man Utd ji zụọ ha oke ọnụ ahịa.
Ndị Chelsea nwekwara obere chi ọjọọ mgba Tammy Abraham nakwa Emmerson gbara ọtụnigwe n'agba nke mbụ.
Ụfọdụ ndị Chelsea ji eme ọnụ esokwaghị n'egwu nke taa n'ihi mmerụ ahụ.

Ebe foto si, Reuters
Ndị a gunyere Antonio Rudiger, Willian, Reuben Loftus-Cheek, nakwa Callum Hudson-Odoi.
Ngolo Kante, onye etiti ndị Chelsea, batara na nkeji iri asaa na anọ.

Etu ihe si kwụrụ ugbua, Man Utd bụzị ndị nke abụọ na EPL ebe ndị mbụ bụ Manchester City.
Liverpool bụ ndị nke atọ ebe Brighton bụ ndị nke anọ.
Mana nke a adịchaghị mkpa ugbua n'ihi na chi ka na-efo efo.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:









