Arsenal vs Newcastle: Arsenal ewerela 'chizoba' zaa aha nna ha

Pierre-Emerick Aubameyang

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Pierre-Emerick Aubameyang nyere goolu na nkeji 58.

Ndị otu egwuregwu bọọlụ Arsenal, esorola ndị Manchester City, Liverpool nakwa Tottenham were gbaa aka ahịa na afọ EPL ọhụrụ.

Arsenal gbalịrị zaa aha nna ha site n'iji otu ọkpụ goolu merie Newcastle taa.

Mana mmeri ahụ akpụghị ọkụ n'ọnụ n'ihi na ha achakeghi ka ọnwa ma ncha.

Aubamenyang bụ onye nyere otu goolu ahụ ha ji gbaa aka ahịa na nkeji iri ise na asatọ.

Pierre-Emerick Aubameyang

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Pierre-Emerick Aubameyang

Lịka lịka niile ndị Newcastlke gbara iji saa otu goolu ahụ amịtaghị mkpụrụ.

Mmeri a ga-atọ Unai Emery, onye nkụzi ndị Arsenal ụtọ maka na ọtụtụ n'ime ndị Arsenal jiri biri esoghi sọọ mpi nke taa.

Aha onyonyo, Ana m egosi ụwa na ndị Naịjirịa abụghị ndị ohi - Kelechi Arsenal

Mmadụ dị ka Alexandre Lacasete nakwa David Luis bu onye e si Chelsea zụta abalị ole na ole gara aga anọghị n'egwu taa.

Ọzọkwa, Pepe, bụ onye Arsenal si Lille na France zụta, esoghi bido bọọlụ taa, kama e tinyere ya etinye na nkeji iri asaa na otu.

Leicester na Wolves

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Leicester na Wolves agbaghị aka ahịa.

N'aka nke ọzọ, onweghi onye meriri na asọmpi nke dị n'etiti Leicester na Wolves.

Ha abụọ gbara onwe ha onye lawa onye lawa.

Anya niile nọzị na ama egwuregwu 'Old Trafford' ebe ndị Manchester United ga-ezute ndị Chelsea.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Igbo foods: Ihe mere anyị ji ericha nri tupu anyị ataa anụ