Arsenal abatala agba nke anọ na Europa league

Arsenal na AC Milan

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Arsenal ji nchịkọta ise merie AC Milan nwere 1

Danny Welbeck gbaara Arsenal akaahịa unyaahụ n'asọmpi ha na AC Milan sọrọ n'ọgbọ egwuruegwu Emirate.

Arsenal gbara AC Milan ọkpụ atọ asatara otu (3 - 1) agbanyeghị na AC Milan bụ ụzọ nye golu.

Welbeck ji penariti saa goolu ahụ ndị AC Milan nyere ma sikwaa ọnwụ tinye ọzọ ka ọ fọrọ nkeji anọ ka e gbuchie bọọlụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ

Ọ bụ Hakan Calhanoglu satara otu goolu ndị AC Milan nyere ihe dịka nkejị anọ Welbeck nyechara goolu penariti ahụ.

Nke a pụtara na Arsenal abanyela n'agba nke kwọta faịnal n'Europa League.

Nke a bụ nke mbụ kemgbe 2010 ndị Arsenal bụ ebe nwafọ Naịjirịa Alex Iwobi na-agba bọọlụ ruru ọgbọ a.

Europa League and CSKA Moscow

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, CSKA Moscow abanyele agba nke anọ n'Europa League

N'otu aka ahụ, ndi otu nwafọ Naịjirịa bụ Ahmed Musa bụ CSKA Moscow, ji ọkpụ atọ asatara abụọ (2 - 3) merie Lyon.

Musa nyere otu golu n'ime goolu atọ ahụ.

Nke ahụ pụtakwara na CSKA abanyela agba nke kwọta faịnal.

A ga-amata ndị ha na ibe ha ga agba boolu mgbe e mechara nhọrọ nke taa.