Food Security: Ihe anọ nwereike ibute oke ụkọ nri na Naịjiria

Ebe foto si, Getty Images
Otu ihe mmadụ ọbụla agaghị achọ ịgabiga n'ụwa a bụ oke agụụ sitere n'ụkọ nri.
Ya ka Igbo ji ekwu na agụụ bụ otigbu nwata n'ihu nne ya.
Na mba Zimbabwe, oke agụụ na-anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ ugbua n'ihi ụkọ mmiri ozuzo nakwa ụkọ ego dịka otu United Nations si maa n'ọkwa.
Nke a kpatara BBC Igbo ji jụọ ndị ọkachamara ihe obodo Naijiria ga-eme iji gbochie oke agụụ n'ọdịnihu.
Ha rụtụrụ aka ihe ole na ole nwereike ibute ụkọ nri na oke agụụ ma kwuo ka gọọmentị were ehihie chọwa ewu ojii tupu chi ejie.
1. Enweghị ezi nchekwa

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ihe gbasara mwakpo ndị Boko Haram nakwa ndị ọchịehi bụzị okwu a kpụ n'ọnụ na Naijiria taa, ọtụtụ ndị mmadụ anaghị agakwa ịkọ ugbo n'ihi ize ndụ.
Ọtụtụ bụ ndị ehi bara n'ubi ha mebichaa ihe ha kọrọ, ebe ndị ọzọ ka ndị ọchịehi wakporo n'ubi ha ma tọrọ ha.
Marlene Udumka bụ onye na-eme nnyocha banyere ịkọpụta nri bụ nke Bekee kpọrọ "Crop Science" kwuru na ihe dị otu a mere gawa, egwu dị maka mmepụta ihe oriri na Naijiria.
2. Oke ire ala maka ịrụ ụlọ

Ebe foto si, Getty Images
Udumka kwukwara na ọ dịghị mma otu e si ere ala e kwesịrị iji kọpụta nri, maka ịrụ ụlọ.
O kwuru sị, "ebe ọbụla ị gara ugbua, ihe na-ewu bụ ịrụ ụlọ.
"Ndị ọgaranya na-aga gbara ala buru ibu, were ya rụọ "Estate", e nweghikwa ubi maka ịkọ nri.
"O kwesịrị ka e nwee mpaghara ala a ga-ewepụta naanị maka iji kọpụta nri, ghara iji ebe niile arụ ụlọ."
3. Oke mmiri ozuzo

Ọ bụ eziokwu na mmiri ozuzu dị mma maka ihe a kụrụ n'ubi, mana oke mmiri adịghị mma.
Dịka Udumka siri kwuo, oke mmiri ozuzo nwere ike ịsachapụ ihe na-enye aka ka ihe a kụrụ n'ubi na-eto ọfụma.
Bekee kpọrọ nke a "Leeching".
Ọ bụrụ na nke a mee ogologo oge, ala ahụ agaghị na-amịtakwa ihe etu o si eme na mbụ.
Mana ndị ọkacha mara kwuru na e nwere ike igbochi nke a site n'ime nke a kpọrọ "mulching".
"Mulching" pụtara iji ahịhịa pụrụ iche maọbụ ịkụ ihe akụkụ nwere ike gbochie mmiri ịsachapụ aja ala.
4. Ume ngwu
Ọkammụta Popoola Yemi, na mkparịtaụka ya na BBC, kwuru na ọtụtụ ndị ntorobịa ugbua dị umengwụ.
Nke a mere na ha na-anọ otu ebe na-eti na gọọmentị enyeghi ha ọrụ.
O kwuru sị: "Ọ bụrụ na ndị ntorobịa tinye anya n'ihe gbasara ịkọpụta nri nakwa ịzụ ụmụanụmanụ, onweghi onye ga-anụ na ọrụ adịghị.
"Ọtụtụ amaghị na nnukwu ego dị n'ịrụ ọrụ ubi."
Yemi gakwara n'ihu kwuo na gọọmentị kwesịrị inyere ndị ntorobịa aka, nye ha ọzụzụ nakwa obere ego ha ga-eji malite ihe dịka ịzụ azụ, ịzụ nchị, ịzụ ezi, ịzụ ejula, na ndị ọzọ.
Ọ dịzị gọọmentị Naijiria na ndị ọha obodo n'aka ibido ugbua gbawa ọsọ mmiri tupu o bido zowe.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Lee ihe nkiri ga-amasị gị:










