Samson Siasia aghọọla 'Eron ' dịka Fifa nyere ya ọsọ ụkwụ eru ala

Samson Siasia

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Samson Siasia rụbụrụ ọrụ dịka onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ Naijiria bụ Super Eagles n'afọ 2011

Otu na-achịkọta egwu bọọlụ na mbaụwa bụ Fifa achụọla Samson Siasia ọsọ ụkwụ ete aja n'egwuregwu bọọlụ maka nrụrụaka.

Ha dakwara ya nha nde naira iri na asatọ n'ụma (N18.5 million/50,000 Swiss dollars).

Kọmịtị Fifa na-ahụ maka agwa ziri ezi kwuru n'ozi ha wepụtara ụbọchị Fraide na ikpe mara Siasia n'ebubo ịna akaazụ were nwogharịa asọmpị ga, nke ha kwuru megidere iwu Fifa.

Aha onyonyo, Onye nchịkọta bọọlụ Salisu Yusuf dịka ọ na-anara ego

E bidoro ikpe Siasia n'ọnwa Febụwarị afọ 2019 ka enyochachara otu nwoke a kpọrọ Wilson Raj Perumal maka ịgbalị inwogharị mpụtara asompi maka inweta chacha.

Ọchụchụ a chụrụ Siasia na-eso mmachi otu na-achịkọta egwu bọọlụ na Naijiria bụ NFF machiri Salisu Yusuf, onye bụbu onye nchịkọta Super Eagles otu afọ maka ịna akaazụ.

Cheta na Siasia chịkọtaburu otu egwu bọọlụ "Super Eagles" mgbe Sunday Oliseh.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: