Ahmad Ahmad's Arrest : A nwụchiela onyeisi CAF maka ebubo nrụrụaka

Ebe foto si, Getty Images
Confederation of African Football(CAF) bụ otu na-achịka egwu bọọlụ n' Afrịka ekwuola n'ezie na anwụchiri onnyeisi ha bụ Ahmad Ahmad na Paris maka 'ihe gbasara nnyocha ọkwa ya dịka onyeisi Caf." maka ghị ihe ọbụla maka kepukepu na ndị uweojii nwụchiri onyeisi ha bụ Ahmad Ahmad maka ebubo nrụrụaka.
Ha kwuru na "Fifa amaghị kpọmkwem ihe gbasara nnyocha ahụ, ya mere na ha enweghị ike ikwu ihe ọ bụla banyere okwu ahụ."
"Fifa na-ajụ ndị gọọmenti France maka ozi banyere nnyocha ahụ nke na-aga na kọmịti na-ahụ maka eziagwa."
Akwụkwọ akụkọ Jeune Afrique kwuru na a nwụchiri Ahmad n'ụtụ Tọzde na Berri Hotel dị na Paris maka ebubo nrụrụaka gbasara ụlọọrụ a kpọrọ, Tactical Steel.
A kagbuola asọmpi Caf ikpeazụ a gbara

Ebe foto si, AFP
Cheta na Caf ekwuru n'asompi ikpeazụ Caf e mere n'abalị May 31, afọ 2019, nke Espérance de Tunis na Wyadd Casablanca gbara adabaghị n'anya ya, ma nye iwu na a ga asọgharị ya.
Ha kwuru na ha ga-enwe mkpebi ebe na ụbọchị a ga-emegharị asọmpi ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post





