Caf Champions League: Akagbuola mmeri Esperance meriri Wydad

Ebe foto si, Reuters
Ka a ka na-ekwu nke ha mere, ngalaba na-ahụ maka egwueregwu bọọlu n'Afrịka bụ Confederation of African Football (Caf) akagbuola mgbacha Iko African Champions League nke otu egwuregwu Esperance nke Tụnịshịa ji otu ọkpụ merie Wydad Casablanca nke Moroko n'ihi ọgbaghara.
Cheta na Casablanca sara ọkpụ goolu enyere ha mana onye na-egbu asọmpị ahụ kagburu ya , nke mere ha ji sị na ha agaghị agbazi asọmpị ahụ, ọkachasị mgbe achọpụtara na igwe VAR ga-ekwu ma nkagbu ahu ọkwụ ọtọ adịghị arụ ọrụ.
Lee otu o siri mee ebe a: Ndọrọndọrọ goolu akagburu echiela Afrịka ọnụ n'ala n'asọmpị ngwụcha CAF

Ebe foto si, AFP
Ugbua, Caf sị na a ga-agbagharị asọmpị ahụ ebe ọzọ agaghị abụ Moroko maọbụ Tunisịa.
Na nkọwa ha, Caf sị na ọkpụ otu agbara n'agba nke mbụ na Moroko ka kwụ.

Ebe foto si, AFP
A ga-agbagharị asọmpi a ma agbachaa Iko Mba Afrịka ga-ebiri ọkụ n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Julaị.
Caf sị "Ọnọdụ asọmpị ahụ agbara na Tunisịa enweghi nchekwa ndụ na ịgba bọọlụ kwụ aka ọtọ" ma gakwa n'ihu nye iwu ka Esperance nyeghachi Iko ha ritere n'asọmpị ahụ.





