CAF Champions League Final: Ndọrọndọrọ goolu na igwe VAR arụghi ọrụ ekweghị ka agbacha asọmpị

Ebe foto si, AFP
N'abalị Mee 31, 2019 ka a gbara asọmpị ngwụcha nke akpọrọ African Champions League, nke butere Wydad Casablanca ka ha zute otu egwuregwu Esperance Tunis na ama egwuregwu Olympique de Rades dị na Tụnịshịa.
Asọmpi ahụ gara etu asọmpị ndị ọzọ na-aga ruo nkeji iri isii na otu mgbe Wydad Casablanca sara ọkpụ goolu ES Tunis nyere ha.
Ka ụmụ egwueregwu Casablanca ka na-eme ka ha racha pịọm, onye na-egbu egwuregwu ahụ kagburu goolu ahụ.
Mba malitere rịwa ibe ya elu. Ịhụ na udo chịrị, ogbu bọọlụ tụrụ aka na igwe Bekee kpọrọ "video Assistant Referee System" (VAR), nke FIFA sịzị na ọ bụ ekwucha ọgwu n'ihe banyere esemokwu n'asọmpị.
Mgbe ahụ ka ihe esinyere n'ekwu sị na ọ gaghị eghe - igwe VAR ekweghị aza oku.

Ebe foto si, AFP
Ka ana-eme ka ana-eme, Igwe VAR gbanyụrụ ọkụ nke mere ndị Casablanca jiri sị na ọ bụghị dị ha ka ana-agwa na nchi ọnya ha matara abụrụla ikuku.
Ụmụ Casablanca were ticha ọkpụ ha, na ha adịghịzị agba bọọlụ ọbụla.

Ebe foto si, EPA
Oge were gagide ka a na-arịọ ka ha kwete n'ihe ogbu bọọlụ kwuru ruo otu elekere na ọma.
Mgbe ahụ ka onyeisi ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ n'Afrịka niile bụ CAF, Maazị Ahmad Ahmad jiir zọbata n'etiti ama egwueregwu ịmata ihe ji nkịta ọnwụ.
Ihe na-eme n'ama egwuregwu mgbe ahụ bụ na ụmụ Esperance Tunis nọ na-agbara onwe ha bọolụ dịka ha na-amụzịrị onwe egwu.
Emechara nye ES Tunis mmeri dịka CAF kwenyere na nkagbu onye na-egbu asọmpị kagburu goolu Casablanca.

Ebe foto si, Reuters
Ihe a abụghi mbu Igwe VAR na ebute ọgbaghara n'egwuregwu bọọlụ, mana nke a dịka anụ kpọrụ nkụ karịrị nwata ọnụ.
Otu egwuregwu abụọ gbaburu otu ọkpụ ọkpụ mgbe a zutere n'agba nke mbụ n'obodo Rabat.
Otu Egwuregwu Esperance ga-anọchịte anya Afrịka n'asọmpị akpọrọ FIFA Club World Cup a ga-agba n'ọnwa Decemba 2019.

Ebe foto si, Reuters








