Ihe mere m jiri kpọchie nwa nwanne nne m n'ụlọ nkịta - Onyinye Mbadike

Nwatanwaanyị e gosiri kpochiri nwanna ya na ụlọ nkịta

Ebe foto si, Instagram/@opetodolapo

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ndị uweojii nke Legọs steeti anwuchiela otu nwaanyị di afọ iri abụọ na anọ maka mmegbu o megburu nwanna ya dị afọ iri ma gbachie ya n'ụlo nkịta.

Ihe onyonyo a ekwughi mgbe ihe a mere kama ọ bụ n'ọnwa a ka ihe onyonyo a bidoro wuwe na 'Twitter'.

Ihe onyonyo a gosiri ebe nwata nwaanyị jị ajị ukwu a pịa nwata nwoke a ihe.

O mechara dọrọ nwantakịrị tie ya ihe ma gbachie ya n'ụlọ nkịta.

Aha onyonyo, "Nwa m dị afọ abụọ furu kemgbe Mee 1"

Nwa nwaanyị sị na nwanna ya a bụ Chibuike Eziamaka kpasuru ya iwe mgbe ọ ṅụchara mmanya ọkụ were jirị okwute mebie enyo ụgbọala ya.

Ihe onyonyo a kpaliri iwe ndị mmadụ nke ukwu nke mere ka ụfọdụ ekwe nkwa ego ka e wee nye onye ga-achọpụta onye nwaagbọghọbịa ahụ.

Ọ bụ na ụbọchị Tụzde ka ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Dolapo Badmus kwuru na Twitter na ha anuchiela nwaagbọghọbịa ahụ.

O dere sị, " Anyi anwuchiela onye echere na ọ bụ ya mere ihe a.. Nwata nwoke ahụ bụ nwa enweghi nne na nna.

Ọ nọ na nlekọta ndị gọomenti na Legos steeti."

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Badmus na ekele ndị ọha mmadụ maka mbọ na enyemaka ha nyere nke ndị uweojii jiri nwuchie nwata nwaanyị a.

Lee akuko ga-amasị g

Lee ihe nkịrị ga-amasị gị

Aha onyonyo, Ihe nwaanyi na-arụ ọrụ ma nọdụ n'ọmụgwọ na-agabiga