Okoi Obono-Obla: Buhari akwụsịla nwa amadi a ọrụ n'ike

Ebe foto si, Okoi Obono-Obla/Facebook
Onyeisiala Naijiria bụ Muuhammadu Buhari akwụsịla Okoi Obono-Obla bụ onyeisi otu pụrụiche e hiwere maka igbapụta akụ na ihe enwenwe gọọmenti Naijiria e zufuru ezufu.
Ụlọọrụ onyeisiala bụ ihe gbnbara nke a nn'anwụ n'akara Twitter ụbọchị Wenezde.
Ha kwuru na nkwụsị ọrụ n'ihe ahụ ga-adịgide ganye na ICPC emechaa nnyocha banyere okwu metụtara nwa amadi ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Nkwụsị ọrụ n'ike a a kwụsịrị na-eso ọtụtụ ebubo e borola ya nke gụnyere ebubo iji asambodo adịgboroja arụ ọrụ.
Nigerian Prisons: Aha ụlọmkpọrọ Naịjirịa bụzi 'Nigerian Correctional Service

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Muhammadu Buhari etinyela aka n'akwụkwọ iwu ga-agbanwe aha ụlọmkpọrọ Naịjirịa site n'ịza Nigerian Prison Service zawa zie Nigerian Correctional Service.
Onye enyemaka ya pụrụiche n'ihe banyere ụlọomeiwu bụ Ita Enang kwupụtara nke nye ndị ntaakụkọ n'Abuja na Wenezde.
Mgbachi ahia ọdụ anụ niile n'Enugwu Steeti

Ndị isi ahịa n'Enugwu esorola nzọmụkwụ otu Miyetti Allah n'ịmachi ogbugbu anụ ọbụla n'abalị abụọ.
Abalị abụọ ahụ bụ ụbọchị 14 na 15 n'ọnwa ọgọst ebe ndị Miyetti Allah manyere ndị otu ha ọzụzụ nchekwa.
N'ime akwụkwọ ozi nke BBC bitere aka, ndị isi ahịa machiri "ogbugbu na ọzụzụ anụ ehi ọbụla"
"Anyị na-agwa ndị otu anyị na a ga-agbachi ụlọ anụ onye ọbụla dara iwu a ebighebi" ka akwụkwọ ozi ahụ kwuru.
Na mba Kenya

Ebe foto si, The Standard
Ndị ọrụ obodo mpaghara ndịda anyanwụ Kenya abọpụtala ozu otu nwoke eji uwe ọrụ ya lie ma yipu uwe ọrụ na-agwaghị ezinaụlọ.
Nwoke a kpọrọ Shikuku Alukoye bụ onye ọrụ obodo Kakamega rue oge ọnwụ ya nke e mere eji were uwe ọrụ lie ya na nkwanye ugwu.
N'egwuregwu

Liverpool na Chelsea ga-anwa ike ha n'asọmpi Iko Uefa Super Cup nke abalị a n'ọgbọ egwuregwu dị n'Istanbul.
Iko Uefa Super na-adị n'etiti ndị mabutere Iko Uefa Champịọns League na ndị mabutere Iko Uefa Europa league.
Nkeji
Buhari agwaala CBN kwụsị ịnye ndị na-ebubata nri dọlla azụmahịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela iwu ka akwụsị inye ndị na-ebubata nri ego dọlla iji zụ ahịa.
Ọ kọwara na nke a bụ maka na nrụpụta ihe oriri n'ala Naịjirịa arịala elu ma kwuo na a ga-eji ego dọlla ahụ ekepụtara dozie obodo.
Na mba ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Aka na-achị Dar-es-salaam na mba Tanzania bụ Paul Makonda ekwuola na ọ ga-adị mma ma enwe ndekọ ụmụnwoke lụrụ nwaanyị n'otu ebe nke ụmụ agbọghọbịa nwereịke ịle anya.
O kwuru na ọ bụ iji belata oke akwamiko nakwa ịgba n'ezi na-emetụta ụmụ nwaanyị kachasị.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Otu Chelsea eferela Kenneth Omeruo aka dịka ha resiri ya otu Leganes kpam kpam.
Omeruo nke otu Chelsea zụrụ n'afọ 2012 agbabeghiri otu ndị nnukwu Chelsea bọọlụ chaa chaa kemgbe a zụrụ ya.












