Dead vultures in Enugu: Ọ bụghị anụ ehi gburu udele nwụrụ n'Eke Ihe

Aha onyonyo, Ehi ga-eberịrị 'moo' tupu e ree ya n'ahịa anyị
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị na-azụ ahịa n'Eke Ihe dị n'Awgụ, Enugwu steeti, ekwuola na ọ bụ eziokwu na udele karịrị ọgụ dara otu mgbe n'ahịa ahụ ma nwụọ ka ha richara anụ ụbọchị satọde, Eke gara aga.

Kama dịka ha si gwa BBC Igbo, ọ bụghị anụ nwụrụ anwụ ha riri gburu ha.

Ha kwuru sị na ọtụtụ ndị mmadụ riri anụ ahụ, mana enweghi ihe ọbụla mere ha.

Ndị ahịa Ihe

Otu onye Ihe gwara onye ntaakụkọ BBC na a na-enyo na o nwereike bụrụ na achịnyere ụtaba n'ime eriri afọ ehi e wepụtara n'ime ehi ahụ nwụrụ anwụ, nke udele ndị ahụ riri tupu ha anwụọ.

Odinkema Ebigbo
Nkọwa foto, Onyeisi ndị na azụ ahịa n'Eke Ihe bụ Odinkemma Ebigbo, kwuru na o che na ọ bụ anụ nwụrụ anwụ ebe ọzọ tupu ebute ya n'ahịa Ihe butere ya bụ ọdachi.

Mgbe BBC rutere Eke Ihe, ọ tọgbọ chakoo n'ihi na taa bụ ụbọchị 22 nke ọnwa Julaị abụghị ụbọchị Eke bụ ụbọchị ahịa ahụ na-azụ.

Onye na-achụ nta n'Ihe bụ Fidelis Okeke, kwuru na ya adọọla ndị na-egbu anụ n'obodo ha aka na ntị n'oge gara aga banyere ire anụ amaghị ebe o si bịa.

Fidelis Okeke
Nkọwa foto, Fidelis Okeke na-achụ nta n'obodo Ihe

Echiche mmadụ niile gbakọrọ n'ahịa ahụ ekwekọrịtaghi na ọ bụ anụ nwụrụ anwụ kpatara ọnwụ udele ndị ahụ.

Ndị nọ n'ahịa

Ọtụtụ ndị obodo kwuru na ha chere na ọ bụ nsị ka e tinyere na ya bụ anụ were bute na be ha, ndị a rịọrọ ka gọọmentị chọpụta na ya bụ anụ enwereike igbu ndị riri ya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ka akụkọ a pụtara na soshal midia, ụfọdụ ndị malitere ikwu na ọ bụ ndị Fulani na-achị ehi tinyere nsị n'anụ ehi ma bubata n'ahịa.

Mana ndị obodo ahụ gwara BBC Igbo na ọ bụghị ihe merenu, n'ihi na ọ bụ otu onye ehi nwụlahụrụ butere ya n'ahịa ka a bọọ ya ma ree ya.

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Lee ka e si achụ nta n'ala Igbo.