Budget 2019: Buhari etinyela aka n'akwụkwọ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyeisiala Buhari binyere aka na Bọjeti 2019

Buhari ebe ọ na-anyeaka na Bọjet 2019

Ebe foto si, BashirAhmed/Twitter

O ruola n'omume, onyeisiala Buhari biyela aka Bọjeti 2019.

Bashir Ahmed onye na-enye onyeisiala Buhari aka depụtara akụkọ a n'igwe Twitter ya:

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ọkọlọtọ IPOB

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, IPOB bidoro nghaghari iwe ya n'afọ 2012

Ndị otu Ipob ekwuola na ọ bụrụ na ndị ọnụ na-eru n'okwu bidoro n'oge kwuwe maka ịmanye Naịjirịa n'okpukpere chi Alakuba , ihe akarị mebi etu ọ dị ugbua.

Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru otu IPOB kwuru na okwu 'Fulanisation ' aka chiburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo bụ okwu Nnamdi Kanu na-ekwuritọ kamgbe.

Cheta na Obasanjo kwuru na ọ bụrụ na-eji aka ike wee ibuso ndị omekome akpọrọ Boko Haram na otu ndị ọzọ na-akpa mkpa mkpa na mpụ ha na-eme karị ịbụ akụkọ ochie.

Jos

Ndị uweojii nọ na Jos ekwuola na ọtụtụ mmadụ nwerike so na ndị nwụrụ anwụ n'ọgbaghara ọhụrụ mere na steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Mathias Tyopev kwuru na ndị otu ya agaala na mpaghara ahụ imenyụ ọgụ a dapụtara ụnyahụ na Dutse Uku, Rikkos nakwa Cele Bridge.

Ụlọ a na-arụ kamgbe afọ 20 adaala n'Owerri

ụlọ ọzọ dara ma dakwasị ndị mmadụ na mpaghara Oke-Arin dị na Lagos Island.

Ebe foto si, Uche Akolisa

Nkọwa foto, Ụlọ ọzọ dara ma dakwasị ndị mmadụ na mpaghara Oke-Arin dị na Lagos Island.

Dịka ndị Anambra ka na-enyocha ihe kpatara ụlọ ji daa n'Onicha, ụlọ ọzọ adaala n'Owerri mana akụkọ na-ewunu bụ na mmadụ anọ sepụtara isi na ya bụ ihe mberede.

N'egwuregwu,

Guardiola na Mubarak

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisi otu egwuregwu Manchesyter city bụ Khaldoon Mubarak ekwuola ndị ibe ha na-ewuru ha anyaọkụ maka etu ha si eme nkeọma n'egwuregwu bọọlụ.

Cheta na ọ bụ ha bu otu egwuregwu beekee bu ụzọ merie iko eguregwu dị iche iche ugboro atọ dịka ha merichara watford na iko FA ọkpụ goolu isii asataghị otu.

N'ofesi,

Ndị njem ụgbọmmiri

Ebe foto si, Getty Images

Ihe mberede ụgbọ mmiri mere na Dr Congo egbuola mmadụ ruru mmadụ iri atọ gụnyere ọtụtụ ndị nkụzi gara ịnata ego ụgwọ ọnwa ha.

Akpụrụ akpụrụ Mary

Ebe foto si, Getty Images

Ebe ndị omekome gbagburu mmadụ anọ n'ụlọụka Katọlik dị na Burkina Faso mgbe a na-aka ụka Sunday.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, Migraine headache: Ihe oke isiọwụwa na-eme n'ụbụrụisi